< Hagai 1 >

1 Katika mwaka wa pili wa mfalme Dario, katika mwezi wa sita, siku ya kwanza ya mwezi, neno la Bwana likaja kwa kwa mkono wa nabii Haghai kwenda kwa gavana wa Yuda, Zerubabeli mwana wa Sheatieli na kuhani mkuu Joshua mwana wa Yehozadaki, kusema,
Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii.
2 “Bwana wa Majeshi asema: 'Hawa watu husema, “Si wakati wetu kuja au kujenga nyumba ya Jehova."””
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’”
3 Tena neno la Bwana lilikuja kwa mkono wa nabii Haghai kusema,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị,
4 “Je ni wakati kwenu wenyewe kuishi katika nyumba zilizokamilika, na wakati nyumba hii inaharibika?
“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”
5 Kwa hiyo sasa Bwana wa Majeshi asema hivi: 'zitafakarini njia zenu!
Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya.
6 Mmepanda mbengu nyingi, lakini mkaleta mavuno kidogo; mnakula lakini hamshibi, mnakunywa lakini hamkujazwa na vinywaji. Mnavaa nguo lakini hampati joto wenyewe, na mtu wa mshahara hupata pesa na kuweka kwenye mfuko wenye mashimo tu!'
Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.”
7 Bwana wa Majeshi asema haya:
Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu.
8 'Zitafakarini njia zetu! Pandeni milimani, mkalete mbao, na mjenge nyumba yangu; na pia nitakuwa radhi na nitatukuzwa!' Asema Bwana.
Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
9 'Mmetazamia kupata vingi, lakini tazama! ulileta nyumbani vichache, nitavitowesha mbali! kwa nini?'- Hivi ndivyo anatamka Bwana wa Majeshi! kwa sababu nyumba yangu inakaa kwenye uharibifu, lakini kila mtu yuko radhi kwenye nyumba yake.
“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.
10 Kwa sababu hii mbingu zimeshikiwa zisitoe umande kutoka kwako, na ardhi imeshikilia haizalishi.
Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi.
11 Nimekuita kutoka juu ya ardhi na juu ya milima, juu ya nafaka na juu ya mzabibu mpya, juu ya mafuta na juu ya mavuno ya ardhi, juu ya watu na juu ya wanyama, na juu ya kazi zote za mikono yako.
Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”
12 Kisha Zerubabeli mwana wa Shelitieli, na kuhani mkuu Yoshua mwana wa Yehozadaki, pamoja na mabaki ya watu, wakati sauti ya Bwana Mungu wao, na maneno ya Nabii Hagai, kwa sababu Bwana Mungu wao alikuwa amemtuma. Na watu wakaogopa uso wa Bwana.
Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.
13 Ndipo Hagai, mjumbe wa Bwana, akaongea ujumbe wa Bwana kwa watu na kusema,”'Niko pamoja na wewe!'- Hili ni tamko la Bwana.
Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
14 Bwana alitibua roho ya mkuu wa mkoa wa Yudah, Zerubabeli mwana wa Sheltieli, na roho ya kuhani mkuu Joshua mwana wa Yehozadaki, na roho ya masalia ya watu, kwa kiasi kwamba wakaenda kufanya kazi katika nyumba ya Bwana Mungu wa majeshi, Mungu wao.
Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha,
15 katika siku ya ishirini na Mwezi wa sita, katika mwaka wa pili wa utawala wa Mfalme Dario.
nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii. Ọ bụ nʼafọ nke abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs,

< Hagai 1 >