< Sefania 1 >

1 Hili ni neno la Yahwe ambalo lilikuja kwa Sefania mwana wa Kushi mwana wa Gedalia mwana wa Amaria mwana Hezekia, katika siku za Yosia mwana wa Amoni, mfalme wa Yuda. “
Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche. Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.
2 Nitaangamiza kabisa kila kitu kutoka usoni mwa dunia - hili ni tamko la Bwana mwenyewe.
“Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
3 Nitamwangamiza mtu na mnyama; Nitawaangamiza ndege wa mbinguni na samaki wa baharini, uharibifu pamoja na waovu. Hivyo nitamfutilia mbali mtu kutoka uso wa dunia - hili ni tamko la Bwana mwenyewe.
“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4 Nitafika kwa mkono wangu juu ya Yuda na wote wenyeji wa Yerusalemu. Nitafutilia mbali kila mabaki ya Baali kutoka sehemu hii na majina ya watu waabuduo sanamu miongoni mwa makuhani,
“Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,
5 watu ambao juu ya nyumba huabudu miili ya mbinguni, na watu ambao huabudu na kuapa kwa Yahwe bali ambao pia huapa kwa mfalme wao.
bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,
6 Nitawafutilia mbali pia wale ambao wamegeuka nyuma kutoka kumfuata Yahwe, wale ambao pia humtafuta Yahwe pasipo kuuliza ulinzi wake.
na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
7 Uwe kimya mbele ya Bwana Yahwe! Kwa kuwa siku ya Yahwe ni karibu, Yahwe ameandaa dhabihu na amewatenga wageni wake.
Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
8 “Itakuja katika siku ya dhabihu ya Bwana, hivyo nitawapiga wakuu na wana wa mfalme, na kila mmoja aliyevikwa mavazi ya kigeni.
“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
9 Katika siku hiyo nitawapiga wote wale ambao huruka juu ya kizingiti, wale ambao hujaza nyumba ya bwana wao kwa vurugu na udanganyifu.
Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.
10 Itakuwa katika siku ile - hili ni tangazo la Yahwe - kwamba kilio cha huzuni kitakuja kutoka kwenye mlango wa samaki, ikipiga yowe kutoka Wilaya ya Pili, na sauti ya kishindo kikuu kutoka vilimani.
“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.
11 Pigeni yowe, wenyeji wa Soko la Wilaya, kwa wote wafanyabiashara watakuwa wameharibiwa, wote wale ambao hupima fedha watakuwa wamefutiliwa mbali.
Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.
12 Itakuwa katika siku ile nitaitafuta Yerusalemu kwa taa na kuwapiga wanaume ambao watakuwa wamekaa kwenye mvinyo wao na kusema mioyoni mwao, 'Yahwe hatafanya chochote, ama kizuri au kiovu.'.
Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’
13 Mali zao zitakuja kuporwa, na nyumba zao zitakuwa zimetelekezwa kwa maangamizi! Watajenga nyumba lakini hawataishi humo, na kupanda mizabibu lakini hawatakunywa mvinyo wake.
Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”
14 Siku kubwa ya Yahwe ni karibu, karibu na inaharakisha upesi! Sauti ya siku ya Yahwe itakuwa ya kilio cha uchungu wa kishujaa!
Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.
15 Siku hiyo itakuwa siku ya ghadabu, siku ya huzuni na uchungu, siku ya dhoruba na maangamizi, siku ya giza na utusitusi, siku ya mawingu na giza nene.
Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,
16 Itakuwa siku ya parapanda na kengele dhidi ya ngome mijini na buruji ndefu.
ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.
17 Hivyo nitaleta dhiki juu ya wanadamu, kwa hiyo watatembea karibu kama wanaume vipofu tangu walipofanya dhambi dhidi ya Yahwe. Damu yao itamwagwa kama vumbi, na sehemu zao za ndani kama kinyesi.
“Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.
18 Wala fedha zao wala dhahabu zao hazitaweza kuwaokoa juu ya ghadhabu ya Yahwe. Ndani ya moto wa wivu wake dunia yote itateketezwa, hivyo ataleta ukamilifu, miwisho wa kutisha kwa wote wakaao duniani.”
Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

< Sefania 1 >