< Hagai 2 >

1 Katika Mwezi wa saba siku ya ishirini na moja ya mwezi, Neno la Bwana lilikuja kwa mkono wa Nabii Hagai, na kusema,
nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị:
2 “Ongea na mkuu wa mkoa wa Yudah, Zerubabeli mwana wa Sheltieli, na kwa kuhani mkuu Yehozadaki; na kwa masalia ya watu. Waambie,
“Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị:
3 Ni nani amebaki kati yenu aliuona utukufu wa nyumba ya kwanza? Na mnauonaje huu wa sasa? Je si kama si chochote machoni penu?
‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.
4 Sasa, muwe hodari, Zerubabeli' -hili ni tamko la Bwana - na uwe hodari, kuhani mkuu Joshua mwana wa Yehozadaki; muwe hodari, enyi watu wa nchi! - hili ni tamko la Bwana - na kazi, kwa kuwa ni pamoja nawe! hili ni tamko la Bwana wa majeshi.
Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
5 Kutegemeana na ahadi ilioko katika agano nililofanya na ninyi mlipotoka Misri na Roho yangu ilisimama katikati yenu, msiogope'
‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
6 Kwa kuwa Bwana wa majeshi anasema hivi: 'kitambo kidogo kwa mara nyingine nitatikisa mbingu na dunia, bahari na nchi kavu!
“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.
7 Na nitatikisa kila taifa, na kila taifa wataleta vitu vya thamani kwangu, na kuijaza nyumba hii na utukufu!' asema Bwana wa Majeshi
Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
8 Dhahabu na fedha ni yangu' - hili ni tamko la Bwana wa majeshi.
‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
9 Utukufu wa nyumba hii utakuwa mkuu zaidi ya utukufu wa nyumba ya kwanza ', asema Bwana wa majeshi,' na nitawapa amani katika sehemu hii'- hili ni Tamko la Bwana wa majeshi
‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
10 Katika siku ya ishirini na nne mwezi wa tisa, mwaka wa pili wa utawala wa Dario, neno la Bwana lilimjia nabii Hagaina kusema,
Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai.
11 “Bwana wa majeshi asema hivi: Muulize kuhani kuhusu sheria, na kusema:
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
12 kama mtu akibeba nyama iliyotolewa kwa Bwana katika pindo la vazi lake, kama upindo utagusa mkate au mchuzi, mvinyo au mafuta, au chakula kingine, je chakula hicho kinafanyika kitakatifu?”Kuhani alijibu akasema, “hapana”
Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”
13 Halafu Hagai akasema.”Kama mtu mchafu najisi kwa ajili ya kumgusa maiti na kugusa vitu hivi, wote wanaweza kuwa wachafu?” Kuhani akajibu na kusema, “Ndiyo, watakuwa wachafu.”
Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”
14 Kwa hiyo Haghai akajibu nakusema, “Ni pamoja na hawa watu na pamoja na taifa liliko mbele yangu! - haya anayasema Bwana- na pia kila kitu kimekwisha kwa mkono wake: walichotoa hakikuwa kisafi kilikuwa kichafu.
Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
15 Kwa hiyo, fikiri kutoka siku hii ya leo na za nyuma, kabla hata jiwe halijawekwa kwenye jiwe lingine katika hekalu la Bwana,
“‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
16 ilikuwaje basi? kila mtu alipokuja kwenye vipimo ishirini vya nafaka, kumbe kulikuwa na vipimo kumi tu, na aliyekuja na aliyekuja kuchota divai ya vipimo hamsini, kumbe kuliwa na vipimo ishirini tu.
Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.
17 Niliwataabisha ninyi na kazi za mikono yenu kwa doa na koga, nalikini hamkunirudia'- asema Bwana.
Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
18 tafakari siku hii ya leo na kuendelea, kutoka siku ya ishirini na nne katika mwezi mwezi wa tisa, toka siku ile msingi wa hekalu la Bwana kuwekwa. Tafakarini hilo!
‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Chezienụ echiche banyere ya.
19 Je, bado kuna mbegu katika ghala? Mzabibu, mti wa mtini, komamanga, na mti wa mzeituni havikuzaa matunda! lakini kutoka siku hii ya leo nitawabariki!”'
Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’”
20 Tena neno la Bwana likaja kwa mara ya pili kwa Haghai siku ya ishiri na nne katika mwezi kusema,
Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị,
21 “Sema na mkuu wa mkoa wa Yuda, Zerubabeli umwambie, 'Nitatikisa mbingu na dunia.
“Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.
22 kwa hiyo nitaanhusha kiti cha falme na kuharibu nguvu ya falme za mataifa! nitaangusha magahari na wapandao; farasi na wapanda farasi wataanguka, kila mmoja kwa sababu ya upanga wa ndugu zake.
Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.
23 Siku hiyo '-hivi ndivyo asema Bwana wa Majeshi- 'Nitakuchukua wewe Zerubabeli mwana wa Sheltieli, kama mtumishi wangu'- hivi ndivyo Bwana anavyosema. “Nitakutuma kama pete ya muhuri wangu, kwa sababu mimi ndiye niliyekuchagua!'- asema Bwana wa majeshi!”
“‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”

< Hagai 2 >