Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 115 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/115 1) Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị. 2) Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” 3) Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme. 4) Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ. 5) Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ; 6) ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla; 7) ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla. 8) Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha. 9) Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 10) Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 11) Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 12) Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn, 13) ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu. 14) Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu. 15) Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu. 16) Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile. 17) Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu; 18) ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!