Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Proverbs Chapter 17 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Proverbs/17 1) Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ. 2) Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ. 3) Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi. 4) Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi. 5) Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ. 6) Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha. 7) Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị. 8) Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma. 9) Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi. 10) Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu. 11) Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya. 12) Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ. 13) Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị. 14) Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite. 15) Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị. 16) Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe. 17) Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa. 18) Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ. 19) Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku. 20) Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu. 21) Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu. 22) Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa. 23) Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi. 24) Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa. 25) Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu. 26) Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi. 27) Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta. 28) A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!