< Zekaria 3 >

1 Kisha Yahwe akanionesha Yoshua kuhani mkuu amesimama mbele za malaika wa Yahwe na Shetani amesimama mkono wake wa kushoto kumshitaki kwa ajili ya dhambi.
Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.
2 Malaika wa Yahwe akamwambia Shetani, “Yahwe na akukemee, Yahwe, aliyeuchagua Yerusalemu, akukemee! Je hiki si kinga kilichotolewa motoni”
Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?”
3 Yoshua alikuwa na mavazi machafu aliposimama mbele ya malaika.
Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.
4 Malaika akawaambia waliosimama mbele yake, “Mvulisheni hayo mavazi machafu.” Kisha akamwambia Yoshua, “Tazama! nimeuondoa uovu wako na nitakuvika mavazi safi.”
Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
5 Haya wamvike kilemba safi kichwani!” Hivyo wakaweka kilemba safi kichwani pa Yoshua na wakamvika mavazi safi wakati malaika wa Yahwe amesimama kando.
Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
6 Kisha malaika wa Yahwe akamwagiza Yoshua na kusema,
Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,
7 Yahwe wa majeshi asema hivi: “Ikiwa utatembea katika njia zangu, na kutunza amri zangu, ndipo utakapoisimamia nyumba yangu na kulinda nyua zangu, kwa maana nitakuruhusu kwenda na kutoka kati ya wasimamao mbele zangu.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
8 WeweYoshua kuhani mkuu na wenzako wanaoishi nawe! Sikilizeni. Watu hawa ni ishara, kwa kuwa mimi mwenyewe nitamwinua mtumishi wangu aitwaye Tawi.
“‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
9 Tazameni jiwe nililoliweka mbele ya Yoshua. Kuna macho saba juu ya jiwe hili moja, nami nitaandika maneno juu yake - asema Yahwe wa majeshi - nami nitaondoa dhambi katika nchi hii kwa siku moja.
Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
10 Katika siku hiyo kila mtu atamwalika jirani yake kukaa chini ya mzabibu na mtini wake.” asema Yahwe wa majeshi.
“‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”

< Zekaria 3 >