< Zaburi 52 >

1 Kwa nini wewe unajivunia kufanya uovu, wewe mtu mwenye nguvu? Uaminifu wa agano la Mungu huja kila siku.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.” Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye Chineke na-eleda anya?
2 Ulimi wako hupanga uharibifu kama wembe mkali, na kufanya udanganyifu.
Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
3 Wewe unapenda uovu kuliko wema na udanganifu kuliko kuongea haki. (Selah)
Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. (Sela)
4 Wewe hupenda maneno ambayo huwaumiza wengine, wewe ulimi mdanganyifu.
O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
5 Vivyo hivyo Mungu atakuadhibu wewe milele; yeye atakuchukua na kukuondoa katika hema yako na kukung'oa katika ardhi ya uhai. (Selah)
Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. (Sela)
6 Wenye haki pia wataona na kuogopa; watamcheka na kusema,
Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,
7 “Tazama, huyu ni mtu ambaye hakumfanya Mungu kuwa kimbilio lake la usalama, bali aliamini katika wingi wa mali zake, naye alikuwa na nguvu alipowaharibu wengine.”
“Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
8 Lakini kwangu mimi, niko kama mti bora wa mzeituni katika nyumba ya Mungu; Nami nitaamini uaminifu wa agano la Mungu milele na milele.
Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
9 Nitakushukuru wewe daima kwa uliyo tenda. Nitalisubiri jina lako, kwa sababu ni zuri, uweponi mwa wantu wako wa kimungu.
Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.

< Zaburi 52 >