< Zaburi 51 >

1 Unirehemu, Mungu, kwa sababu ya uaminifu wa agano lako; kwa ajili ya wingi wa matendo yako ya rehema, uyafute makosa yangu.
Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
2 Unioshe kabisa uovu wangu na unisafishe dhambi zangu.
Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
3 Kwa maana ninayajua makosa yangu, na dhambi yangu iko mbele yako siku zote.
Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
4 Dhidi yako, wewe pekee, nimetenda dhambi na kufanya uovu mbele ya macho yako; uko sawa usemapo; wewe uko sahahi utoapo hukumu.
Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
5 Tazama, nilizaliwa katika uovu; pindi tu mama yangu aliponibeba mimba, nilikuwa katika dhambi. Tazama, wewe unahitaji uaminifu ndani ya moyo wangu;
Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
6 katika moyo wangu wewe utanifanya niijue hekima.
Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
7 Unisafishe kwa hisopo, nami nitakuwa safi; unioshe, nami nitakuwa mweupe kuliko theluji.
Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
8 Unifanye kusikia furaha na shangwe ili kwamba mifupa ulioivunja ifurahi.
Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
9 Uufiche uso wako mbali na dhambi zangu na uyafute maovu yangu yote.
Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
10 Uniumbie moyo safi, Mungu, na uifanye upya roho ya haki ndani yangu.
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
11 Usiniondoe uweponi mwako, na usimuondoe roho Mtakatifu ndani yangu.
Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
12 Unirudishie furaha ya wokovu wako, na unihifadhi mimi kwa roho ya utayari.
Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
13 Ndipo nitawafundisha wakosaji jia zako, na wenye dhambi watakugeukia wewe.
Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
14 Unisamehe kwa ajili ya umwagaji damu, Mungu wa wokovu wangu, nami nitapiga kelele za shangwe ya haki yako.
O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
15 Ee Bwana, uifungue midomo yangu, na mdomo wangu itazieleza sifa zako.
O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
16 Kwa maana wewe haufurahishwi katika sadaka, vinginevyo ningekutolea sadaka; wewe hauwi radhi katika sadaka ya kuteketezwa.
Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
17 Sadaka ya Mungu ni roho iliyovunjika. Wewe, Mungu hautadharau moyo uliopondeka na kujutia.
Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
18 Uitendee mema Sayuni katika nia yako nzuri; uzijenge tena kuta za Yerusalem.
Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
19 Kisha wewe utafurahia sadaka yenye haki, katika sadaka za kuteketeza; ndipo watu wetu watatoa ng'ombe kwenye madhabahu yako.
Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

< Zaburi 51 >