< Yoshua 19 >

1 Upigaji wa pili wa kura uliangukia kwa Simoni na waligawiwa kwa kila ukoo wao. Urithi wao ulikuwa katikati ya urithi ulikuwa ni mali ya kabila la Yuda.
Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.
2 Urithi waliokuwa nao ni Beerisheba, Sheba, Molada,
Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada,
3 Hazari Shuali, Bala, Ezemu,
Haza Shual, Bala, Ezem,
4 Elitoladi, Bethuli na Horma.
Eltolad, Betul, Homa,
5 Simoni alikuwa pia na Ziklagi, Bethi Markabothi, Hazari Susa,
Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,
6 Bethi Lebaothi, na Sharuheni. Kulikuwa na miji kumi na mitatu pamoja na vijiji vyake. Vile vile
Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
7 Simoni alimiliki Aini, Rimon, Etheri, na Ashani. Hii ilikuwa ni miji minne pamoja na vijiji vyake.
Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,
8 Miji hii pamoja na vijiji vilivyoizunguka hata kufika Baalathi Beeri (ambao ndio Rama katika Negevu). Huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Simoni, waliopewa kwa koo zao.
tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.
9 Urithi wa kabila la Simoni ulikuwa sehemu ya himaya ya kabila la Yuda. Hii ni kwasababu nchi waliyopewa kabila la Yuda ilikuwa ni kubwa kwao, na hivyo kabila la Simoni lilipokea urithi wao kutoka katika sehemu yao ya katikati.
E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.
10 Upigaji wa kura ya tatu uliangukia kwa kabila la Zabuloni, na walipewa kwa koo zao. Mpaka wa urithi wao ulianzia huko Saridi.
Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.
11 Mpaka wao ulipanda upande wa magharibi kuelekea Marala na ukaigusa Dabeshethi, na kisha ukasonga kuelekea kijito kilichokuwa mkabala na Yokineamu.
Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.
12 Kutoka Saridi mpaka ulizunguka upande wa mashariki kuelekea mashariki na ulienda hadi mpaka wa Kislothi Tabori. Kutoka hapo uliendelea hadi Daberathi na kisha ulipanda hata Yafia.
O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.
13 Kutoka hapo ulipita katika upande wa mashariki mwa Gathi Heferi, na kisha ukafika Ethikazini, baadaye ulienda hadi Rimoni na kisha ukageuka kuelekea Nea.
Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.
14 Mpaka ulizunguka kueleka kaskazini ukafika Hanathoni na ulikomea katika bonde la Ifta Eli.
Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
15 Mkoa huu ulijumuisha miji ya Katathi, Nahalali, Shimroni, Idala, na Bethlehemu. Kulikuwa na miji kumi na miwili, pamoja na vijiji vyake.
Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
16 Huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Zabuloni, waliopewa kwa kufuatana na koo zao - miji pamoja na vijiji vyake.
Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
17 Upigaji kura wa nne uliangukia kwa Isakari, na waligawiwa kufuatana na koo zao.
Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.
18 Eneo lao lilijumuisha Jezreelli, Kesuloothi, Shunemu,
Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem,
19 Hafaraimu, Shioni, na Anaharathi.
Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,
20 Pia ilijumuisha miji ya Rabithi, Kishioni, Ebezi,
Rabit, Kishiọn, Ebez na
21 Remethi, Enganimu, Enihada, na Bethipazezi.
Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.
22 Mpaka wao ulifika Tabor, Shahazuma, na Bethi Shemeshi, na ukakomea katika Yordani. Ilikuwa ni miji kumi na sita, pamoja na vijiji vyake.
Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
23 Huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Isakari, na walipewa kufuatana na koo zao - miji pamoja na vijiji vyake.
Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.
24 Upigaji wa kura ya tano uliangukia kwa kabila la Asheri, na walipewa kwa koo zao.
Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.
25 Eneo lao lilijumuisha miji ya Helikathi, Hali, Beteni, Akashafu,
Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
26 Alameleki, Amadi, na Mshali. Mpaka wa magharibi ulitanuka hadi Karmeli na Shihori Libnathi.
Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
27 Kisha ulizunguka upande wa mashariki kueleka Bethi Dagoni na ukaenda hadi Zabuloni, na kisha ukafika katika bonde la ifutaheli, upande wa kaskazini mwa Bethemeki na Neieli. Baadaye uliendelea mbele hata Kabuli kueleka upande wa Kaskazini.
O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
28 Na kisha ulienda hadi Ebroni, Rehobu, Hammoni, na Kana, hata kufika mji mkubwa wa Sidoni.
Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
29 Mpaka ulirudi nyuma kuelekea Rama, na kisha ukafika kwenye mji wa Tiro uliokuwa na ngome. Baada ya hapo mpaka ulizunguka kuelekea Hosa na ulikomea katika bahari, katika mkoa wa Akizibu,
Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
30 Umma, Afeki, na Rehobu. Kulikuwa na miji ishirini na miwili, pamoja na vijiji vyake.
na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
31 Huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Asheri, na waliopewa kwa koo zao - miji pamoja na vijiji vyake.
Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
32 Upigaji wa kura wa mara ya sita uliangukia kwa kabila la Nafutali, na walipewa kufuatana na koo zao.
Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.
33 Mpaka wao ulianzia Helefu, kutoka katika mwaloni huko Zaananimu, ulipanda hadi Adaminekebu na Yabneeli, umbali kama Lakumu; na ulikomea katka Yordani.
Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
34 Mpaka ule ulizunguka upande wa magharibi kuelekea Aznothi Tabori na ulipanda hadi Hukoki; uligusa Zabuloni katika upande wa kusini, na ulifika hata Asheri katika upande wa magharibi, na Yuda katika upande wa mashariki huko katika mto Yordani.
Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
35 Miji yenye ngome ilikuwa ni Zidimu, Zeri, Hammathi, Rakathi, Kinnerethi,
Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
36 Adama, Rama, Hazori,
Adama, Rema, Hazọ,
37 Kedeshi, Edrei, na Eni Hazori.
Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
38 Pia kulikuwa na miji ya Yironi, Migdaleli, Horemu, Bethi Anathi, na Bethi Shemeshi. Kulikuwa na miji kumi na tisa, pamoja na vijiji vyake.
Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
39 Huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Nafutali, na walipewa miji pamoja na vijiji vyake kufuatana na koo zao.
Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.
40 Upigaji wa kura ya saba uliangukia kwa kabila la Dani, na walipewa kufuatana na koo zao.
Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.
41 Eneo lao la urithi lilijumuisha miji ya Zora, Eshitaoli, Iri Shemeshi,
Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh,
42 Shaalabini, Aijaloni, na Ithila.
Shaalabin, Aijalon, Itla,
43 Vile vile lilijumuisha miji ya Eloni, Timna, Ekroni,
Elọn, Timna, Ekrọn,
44 Eliteke, Gibethoni, Baalathi,
Elteke, Gibeton, Baalat,
45 Yehudi, Bene - Beraki, Gathi Rimoni,
Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,
46 Me -Yarkoni, na Rakoni sambamba na eneo la karibu na Yopa.
Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.
47 Ilitokea wakati mpaka wa kabila la Dani ulipowapotea, kabila la Dani waliishambulia Leshemu, wakapigana nao, na wakauteka. Waliua kila mtu kwa upanga, wakauchukua ukawa mali yao, na wakakaa ndani yake. Wakauita mji ule Dani jina la babu yao badala ya Leshemu.
Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.
48 Huu ulikuwa urithi wa kabila la Dani, waliopewa kufuatana na koo zao - miji pamoja na vijiji vyake.
Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
49 Walipomaliza kugawana urithi wa nchi, watu wa Israeli walimpa urithi Yoshua mwana wa Nuni kutoka miongoni mwao.
Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.
50 Kwa amri ya Yahweh walimpatia mji wa Timnathi Sera ambao aliuomba, ulikuwa katika nchi ya milima ya Efraimu. Aliujenga mji na akaishi huko.
Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.
51 Na huu ndio urithi ambao Eliazari kuhani, na Yoshua mwana wa Nuni, na viongozi wa makabila ya familia za mababu zao miongoni mwa watu wa Israeli, waligawa kwa kupiga kura huko Shilo, mbele za Yahweh katika mlango wa hema la kukutania. Na hivyo wakamaliza kuigawa nchi.
Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.

< Yoshua 19 >