< Yoshua 18 >

1 Kisha kusanyiko lote la watu wa Israeli walikusanyika pamoja hapo Shilo. Walilijenga hema la kukutania hapo na waliishinda nchi mbele yao.
Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,
2 Kulikuwa na makabila saba miongoni mwa watu wa Israeli ambayo yalikuwa bado hayajapewa urithi wao.
ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.
3 Yoshua aliwaambia watu wa Israeli, “Je mtaacha mpaka lini katika kuingia nchi ambayo Yahweh, Mungu wa baba zenu, amewapeni ninyi?
Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?
4 Chagueni ninyi wenyewe watu watatu kutoka katika kila kabila, na nitawatuma. Wataenda na kuipeleleza nchi juu na chini. Wataandika maelezo pamoja na maelekezo kuhusu urithi wao, na kisha watarudi kwangu.
Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.
5 Wataigawanya nchi katika sehemu saba. Yuda itasalia katika eneo lao upande wa kusini, na nyumba ya Yusufu itaendelea katika himaya yao katika upande wa kaskazini.
Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.
6 Mtaigawanya nchi katika sehemu saba na kisha mtaniletea maelezo hayo hapa kwangu. Nami nitapiga kura kwa ajili yenu hapa mbele za Yahweh Mungu wetu.
Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.
7 Walawi hana sehemu miongoni mwenu, kwa kuwa ukuhani wa Yahweh ni urithi wao. Makabila ya Gadi, Rubeni na nusu ya kabila la Manase wameshapokea urithi wao ng'ambo ya Yordani. Huu ni urithi ambao Musa mtumishi wa Yahweh aliwapa wao.
Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”
8 Hivyo, watu waliinuka na wakaenda. Yoshua akawaamuru wale walioenda kuandika maelezo ya nchi, akisema, “Pandeni juu na mshuke chini katika nchi na andikeni maelezo kuhusu nchi na kisha mrejee kwangu. Nitapiga kura kwa ajili yenu hapa mbele za Yahweh huko Shilo.
Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”
9 Watu walienda na walitembea juu na chini katika nchi na wakaandika maelezo kuihusu nchi hiyo juu ya gombo kwa miji yake katika sehemu saba, kwa kutaja miji, kila mmoja katika sehemu moja. Kisha wakarudi kwa Yoshua katika kambi huko Shilo.
Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo.
10 Kisha Yoshua akapiga kura kwa ajili yao huko Shilo mbele za Yahweh. Na hapo Yoshua akaigawa nchi kwa watu wa Israeli, kila kabila lilipewa sehemu ya nchi.
Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.
11 Katika kabila la Benyamini, ugawanaji wa nchi ulifanyika kwa kupewa kwa koo zao. Eneo la nchi waliyopewa lilikuwa kati ya wazawa wa Yuda na wazawa wa Yusufu.
Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.
12 Katika upande wa kusini, mpaka wao ulianzia katika Yordani. Mpaka ulipanda hata sehemu ya juu kaskazini mwa Yeriko, na kisha ukapita katikati ya nchi ya milima upande wa magharibi. Huko ukafika hadi nyika ya Bethi Aveni.
Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.
13 Kutoka hapo mpaka ulipita upande wa kusini katika mwelekeo wa Luzi (sehemu ile ile inayoitwa Betheli). Kisha mpaka ukashuka chini hata Atarothi Adda, karibu na mlima uliolekea kusini mwa Bethi Horoni.
Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.
14 Kisha mpaka ukaendelea upande mwingine: katika upande wa magharibi uligeukia upande wa kusini, ulienda mbele kuukabili mlima ulio ng'ambo ya Bethi Horoni. Mpaka huu ulikomea huko Kiriathi Baali ( ambao ndio Kiriathi Yearimu), mji ambao ulikuwa ni wa kabila la Yuda. Na huu ndio ulikuwa ni mpaka katika upande wa magharibi.
Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.
15 Katika upande wa kusini, mpaka ulianzia nje tu ya Kiriathi Yearimu. Mpaka uliendelea kutoka Efroni hata chemichemi ya maji ya Neftoa.
Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.
16 Kisha mpaka ulishuka chini hadi mpaka wa mlima ambao ulikuwa mkabala ya bonde la Beni Hinomu, ambalo lililokuwa katika upande wa kaskazini mwishoni mwa bonde la Refaimu. Kisha ulishuka chini kuelekea bonde la Hinomu, sehemu ya kusini mwa mteremko wa Wayebusi, na uliendelea kushuka chini hadi Eni Rogeli.
O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.
17 Ulizunguka upande wa kaskazini, kuelekea mwelekeo wa Eni Shemeshi, na kutoka hapa ulienda hadi Gelilothi, ambao ulikuwa mkabala na mwinuko wa Adumimu. Kisha ulishuka chini kuelekea Jiwe la Bohani mwana wa Rubeni.
Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
18 Ulipita kuelekea upande wa kaskazini wa bega la Bethi Araba na chini kuelekea Araba.
O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,
19 Mpaka ulipita hadi upande wa bega la kaskazini la Bethi Hogla. Mpaka ulikome katika ghuba ya kaskazini mwa Bahari ya Chumvi, katika upande wa kusini mwishoni mwa Yordani. Huu ulikuwa ni mpaka wa upande wa kusini.
ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.
20 Yordani ulikuwa mpaka wake katika upande wa mashariki. Na huu ulikuwa ni urithi wa kabila la Benyamini, na walipewa kwa kila ukoo wao, mpaka baada ya mpaka, kwa kuizunguka nchi yote.
Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile.
21 Kwa hiyo sasa miji ya kabila la Benyamini kufuatana na koo zao ilikuwa ni Yeriko,
Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị: Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz,
22 Bethi Hogla, Emeki Kezizi, Bethi Araba, Zemaraimu, Betheli,
Bet-Araba, Zemaraim, Betel,
23 Avimu, Para, Ofra,
Avim, Para, Ofra,
24 Kefari Amoni, Ofini, na Geba. Ilikuwa ni miji kumi na miwili, pamoja na vijiji vyake.
Kefa Amoni, Ofni, Geba, obodo iri na abụọ na obodo nta ha ndị ọzọ.
25 Kulikuwa pia na miji ya Gibeoni, Rama, Beerothi,
Na Gibiọn, Rema, Beerọt,
26 Mizpe, Kefira, Moza,
Mizpa, Kefira, Moza,
27 Rekemu, Iripeeli, Tarala,
Rekem, Iapeel, Tarala,
28 Zela, Haelefu, Yebusi (ambao ndio Yerusalemu), Gibea, na Kiriathi. Kulikuwa na miji kumi na nne, pamoja na vijiji vyake. Huu ulikuwa ni urithi wa Benyamini kufuatana na koo zao.
Zela, Haelef na obodo ndị Jebus, nke aha ya bụ Jerusalem, Gibea na Kiriat Jearim, obodo iri na anọ na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin maka ikwu ya niile.

< Yoshua 18 >