< Canticum Canticorum 7 >

1 Quam pulchri sunt gressus tui in calceamentis, filia principis! Iuncturæ femorum tuorum, sicut monilia, quæ fabricata sunt manu artificis.
Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.
2 Umbilicus tuus crater tornatilis, numquam indigens poculis. Venter tuus sicut acervus tritici, vallatus liliis.
Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.
3 Duo ubera tua, sicut duo hinnuli gemelli capreæ.
Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.
4 Collum tuum sicut turris eburnea. Oculi tui sicut piscinæ in Hesebon, quæ sunt in porta filiæ multitudinis. Nasus tuus sicut turris Libani, quæ respicit contra Damascum.
Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.
5 Caput tuum ut Carmelus: et comæ capitis tui, sicut purpura regis vincta canalibus.
Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo. Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.
6 Quam pulchra es, et quam decora charissima, in deliciis!
Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.
7 Statura tua assimilata est palmæ, et ubera tua botris.
Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ; ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.
8 Dixi: Ascendam in palmam, et apprehendam fructus eius: et erunt ubera tua sicut botri vineæ: et odor oris tui sicut malorum.
Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ, jidekwa mkpụrụ ya aka.” Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,
9 Guttur tuum sicut vinum optimum, dignum dilecto meo ad potandum, labiisque et dentibus illius ad ruminandum.
ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. Onye a hụrụ nʼanya Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
10 Ego dilecto meo, et ad me conversio eius.
Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.
11 Veni dilecte mi, egrediamur in agrum, commoremur in villis.
Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.
12 Mane surgamus ad vineas, videamus si floruit vinea, si flores fructus parturiunt, si floruerunt mala Punica: ibi dabo tibi ubera mea.
Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru, ma okoko ya agbawaala, ma osisi pomegranet agbawaala okoko. Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.
13 Mandragoræ dederunt odorem. In portis nostris omnia poma: nova et vetera, dilecte mi, servavi tibi.
Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki na-ewepụta; mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie, nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.

< Canticum Canticorum 7 >