< תהילים 55 >

למנצח בנגינת משכיל לדוד האזינה אלהים תפלתי ואל תתעלם מתחנתי׃ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị;
הקשיבה לי וענני אריד בשיחי ואהימה׃ 2
ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude
מקול אויב מפני עקת רשע כי ימיטו עלי און ובאף ישטמוני׃ 3
nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
לבי יחיל בקרבי ואימות מות נפלו עלי׃ 4
Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
יראה ורעד יבא בי ותכסני פלצות׃ 5
Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.
ואמר מי יתן לי אבר כיונה אעופה ואשכנה׃ 6
Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
הנה ארחיק נדד אלין במדבר סלה׃ 7
Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; (Sela)
אחישה מפלט לי מרוח סעה מסער׃ 8
Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
בלע אדני פלג לשונם כי ראיתי חמס וריב בעיר׃ 9
O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.
יומם ולילה יסובבה על חומתיה ואון ועמל בקרבה׃ 10
Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya.
הוות בקרבה ולא ימיש מרחבה תך ומרמה׃ 11
A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
כי לא אויב יחרפני ואשא לא משנאי עלי הגדיל ואסתר ממנו׃ 12
A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
ואתה אנוש כערכי אלופי ומידעי׃ 13
Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
אשר יחדו נמתיק סוד בבית אלהים נהלך ברגש׃ 14
onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.
ישימות עלימו ירדו שאול חיים כי רעות במגורם בקרבם׃ (Sheol h7585) 15
Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. (Sheol h7585)
אני אל אלהים אקרא ויהוה יושיעני׃ 16
Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.
ערב ובקר וצהרים אשיחה ואהמה וישמע קולי׃ 17
Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m.
פדה בשלום נפשי מקרב לי כי ברבים היו עמדי׃ 18
Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
ישמע אל ויענם וישב קדם סלה אשר אין חליפות למו ולא יראו אלהים׃ 19
Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. (Sela)
שלח ידיו בשלמיו חלל בריתו׃ 20
Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
חלקו מחמאת פיו וקרב לבו רכו דבריו משמן והמה פתחות׃ 21
Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
השלך על יהוה יהבך והוא יכלכלך לא יתן לעולם מוט לצדיק׃ 22
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
ואתה אלהים תורדם לבאר שחת אנשי דמים ומרמה לא יחצו ימיהם ואני אבטח בך׃ 23
Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

< תהילים 55 >