< תהילים 54 >

למנצח בנגינת משכיל לדוד בבוא הזיפים ויאמרו לשאול הלא דוד מסתתר עמנו אלהים בשמך הושיעני ובגבורתך תדינני׃ 1
Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.
אלהים שמע תפלתי האזינה לאמרי פי׃ 2
O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.
כי זרים קמו עלי ועריצים בקשו נפשי לא שמו אלהים לנגדם סלה׃ 3
Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. (Sela)
הנה אלהים עזר לי אדני בסמכי נפשי׃ 4
Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
ישוב הרע לשררי באמתך הצמיתם׃ 5
Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
בנדבה אזבחה לך אודה שמך יהוה כי טוב׃ 6
Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
כי מכל צרה הצילני ובאיבי ראתה עיני׃ 7
Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

< תהילים 54 >