< תהילים 128 >

שיר המעלות אשרי כל ירא יהוה ההלך בדרכיו׃ 1
Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
יגיע כפיך כי תאכל אשריך וטוב לך׃ 2
Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
אשתך כגפן פריה בירכתי ביתך בניך כשתלי זיתים סביב לשלחנך׃ 3
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.
הנה כי כן יברך גבר ירא יהוה׃ 4
Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
יברכך יהוה מציון וראה בטוב ירושלם כל ימי חייך׃ 5
Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
וראה בנים לבניך שלום על ישראל׃ 6
ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.

< תהילים 128 >