< תהילים 120 >

שיר המעלות אל יהוה בצרתה לי קראתי ויענני׃ 1
Abụ nrigo. Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m.
יהוה הצילה נפשי משפת שקר מלשון רמיה׃ 2
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
מה יתן לך ומה יסיף לך לשון רמיה׃ 3
Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?
חצי גבור שנונים עם גחלי רתמים׃ 4
Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
אויה לי כי גרתי משך שכנתי עם אהלי קדר׃ 5
Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
רבת שכנה לה נפשי עם שונא שלום׃ 6
Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.
אני שלום וכי אדבר המה למלחמה׃ 7
Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.

< תהילים 120 >