< איוב 30 >

ועתה שחקו עלי צעירים ממני לימים אשר מאסתי אבותם לשית עם כלבי צאני׃ 1
“Ma ugbu a, ha na-akwa m emo bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ, bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.
גם כח ידיהם למה לי עלימו אבד כלח׃ 2
Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m, ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?
בחסר ובכפן גלמוד הערקים ציה אמש שואה ומשאה׃ 3
Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
הקטפים מלוח עלי שיח ושרש רתמים לחמם׃ 4
Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
מן גו יגרשו יריעו עלימו כגנב׃ 5
A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
בערוץ נחלים לשכן חרי עפר וכפים׃ 6
A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
בין שיחים ינהקו תחת חרול יספחו׃ 7
Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ, na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
בני נבל גם בני בלי שם נכאו מן הארץ׃ 8
Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha, e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
ועתה נגינתם הייתי ואהי להם למלה׃ 9
“Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo; abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.
תעבוני רחקו מני ומפני לא חשכו רק׃ 10
Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso; ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.
כי יתרו פתח ויענני ורסן מפני שלחו׃ 11
Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m, o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.
על ימין פרחח יקומו רגלי שלחו ויסלו עלי ארחות אידם׃ 12
Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
נתסו נתיבתי להותי יעילו לא עזר למו׃ 13
Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
כפרץ רחב יאתיו תחת שאה התגלגלו׃ 14
Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
ההפך עלי בלהות תרדף כרוח נדבתי וכעב עברה ישעתי׃ 15
Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
ועתה עלי תשתפך נפשי יאחזוני ימי עני׃ 16
“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga; ụbọchị ahụhụ ejidela m.
לילה עצמי נקר מעלי וערקי לא ישכבון׃ 17
Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
ברב כח יתחפש לבושי כפי כתנתי יאזרני׃ 18
Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.
הרני לחמר ואתמשל כעפר ואפר׃ 19
Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja.
אשוע אליך ולא תענני עמדתי ותתבנן בי׃ 20
“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.
תהפך לאכזר לי בעצם ידך תשטמני׃ 21
Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m.
תשאני אל רוח תרכיבני ותמגגני תשוה׃ 22
Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.
כי ידעתי מות תשיבני ובית מועד לכל חי׃ 23
Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.
אך לא בעי ישלח יד אם בפידו להן שוע׃ 24
“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
אם לא בכיתי לקשה יום עגמה נפשי לאביון׃ 25
Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?
כי טוב קויתי ויבא רע ואיחלה לאור ויבא אפל׃ 26
Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
מעי רתחו ולא דמו קדמני ימי עני׃ 27
Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m.
קדר הלכתי בלא חמה קמתי בקהל אשוע׃ 28
Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.
אח הייתי לתנים ורע לבנות יענה׃ 29
Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
עורי שחר מעלי ועצמי חרה מני חרב׃ 30
Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.
ויהי לאבל כנרי ועגבי לקול בכים׃ 31
Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.

< איוב 30 >