< איוב 16 >

ויען איוב ויאמר׃ 1
Mgbe ahụ, Job zara sị:
שמעתי כאלה רבות מנחמי עמל כלכם׃ 2
“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.
הקץ לדברי רוח או מה ימריצך כי תענה׃ 3
Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?
גם אנכי ככם אדברה לו יש נפשכם תחת נפשי אחבירה עליכם במלים ואניעה עליכם במו ראשי׃ 4
Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi m megide unu.
אאמצכם במו פי וניד שפתי יחשך׃ 5
Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.
אם אדברה לא יחשך כאבי ואחדלה מה מני יהלך׃ 6
“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?
אך עתה הלאני השמות כל עדתי׃ 7
Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.
ותקמטני לעד היה ויקם בי כחשי בפני יענה׃ 8
I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.
אפו טרף וישטמני חרק עלי בשניו צרי ילטוש עיניו לי׃ 9
Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
פערו עלי בפיהם בחרפה הכו לחיי יחד עלי יתמלאון׃ 10
Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.
יסגירני אל אל עויל ועל ידי רשעים ירטני׃ 11
Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
שלו הייתי ויפרפרני ואחז בערפי ויפצפצני ויקימני לו למטרה׃ 12
Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;
יסבו עלי רביו יפלח כליותי ולא יחמול ישפך לארץ מררתי׃ 13
ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
יפרצני פרץ על פני פרץ ירץ עלי כגבור׃ 14
Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.
שק תפרתי עלי גלדי ועללתי בעפר קרני׃ 15
“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya m nʼime ntụ.
פני חמרמרה מני בכי ועל עפעפי צלמות׃ 16
Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;
על לא חמס בכפי ותפלתי זכה׃ 17
ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.
ארץ אל תכסי דמי ואל יהי מקום לזעקתי׃ 18
“Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!
גם עתה הנה בשמים עדי ושהדי במרומים׃ 19
Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.
מליצי רעי אל אלוה דלפה עיני׃ 20
Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.
ויוכח לגבר עם אלוה ובן אדם לרעהו׃ 21
Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.
כי שנות מספר יאתיו וארח לא אשוב אהלך׃ 22
“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.

< איוב 16 >