< איוב 11 >

ויען צפר הנעמתי ויאמר׃ 1
Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
הרב דברים לא יענה ואם איש שפתים יצדק׃ 2
“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?
בדיך מתים יחרישו ותלעג ואין מכלם׃ 3
Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?
ותאמר זך לקחי ובר הייתי בעיניך׃ 4
Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
ואולם מי יתן אלוה דבר ויפתח שפתיו עמך׃ 5
Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.
ויגד לך תעלמות חכמה כי כפלים לתושיה ודע כי ישה לך אלוה מעונך׃ 6
Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
החקר אלוה תמצא אם עד תכלית שדי תמצא׃ 7
“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
גבהי שמים מה תפעל עמקה משאול מה תדע׃ (Sheol h7585) 8
Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? (Sheol h7585)
ארכה מארץ מדה ורחבה מני ים׃ 9
Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.
אם יחלף ויסגיר ויקהיל ומי ישיבנו׃ 10
“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?
כי הוא ידע מתי שוא וירא און ולא יתבונן׃ 11
Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?
ואיש נבוב ילבב ועיר פרא אדם יולד׃ 12
Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.
אם אתה הכינות לבך ופרשת אליו כפך׃ 13
“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,
אם און בידך הרחיקהו ואל תשכן באהליך עולה׃ 14
ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị
כי אז תשא פניך ממום והיית מצק ולא תירא׃ 15
mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.
כי אתה עמל תשכח כמים עברו תזכר׃ 16
Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.
ומצהרים יקום חלד תעפה כבקר תהיה׃ 17
Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.
ובטחת כי יש תקוה וחפרת לבטח תשכב׃ 18
Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
ורבצת ואין מחריד וחלו פניך רבים׃ 19
Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
ועיני רשעים תכלינה ומנוס אבד מנהם ותקותם מפח נפש׃ 20
Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”

< איוב 11 >