< הושע 9 >

אל תשמח ישראל אל גיל כעמים כי זנית מעל אלהיך אהבת אתנן על כל גרנות דגן׃ 1
Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.
גרן ויקב לא ירעם ותירוש יכחש בה׃ 2
Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
לא ישבו בארץ יהוה ושב אפרים מצרים ובאשור טמא יאכלו׃ 3
Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
לא יסכו ליהוה יין ולא יערבו לו זבחיהם כלחם אונים להם כל אכליו יטמאו כי לחמם לנפשם לא יבוא בית יהוה׃ 4
Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
מה תעשו ליום מועד וליום חג יהוה׃ 5
Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
כי הנה הלכו משד מצרים תקבצם מף תקברם מחמד לכספם קמוש יירשם חוח באהליהם׃ 6
A sịkwa na ha agbanarị mbibi, ndị Ijipt ga-achịkọta ha. Ndị Memfis ga-elikwa ha. Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,
באו ימי הפקדה באו ימי השלם ידעו ישראל אויל הנביא משגע איש הרוח על רב עונך ורבה משטמה׃ 7
Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
צפה אפרים עם אלהי נביא פח יקוש על כל דרכיו משטמה בבית אלהיו׃ 8
Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.
העמיקו שחתו כימי הגבעה יזכור עונם יפקוד חטאתם׃ 9
Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. Ọ ga-echeta njehie ha. Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
כענבים במדבר מצאתי ישראל כבכורה בתאנה בראשיתה ראיתי אבותיכם המה באו בעל פעור וינזרו לבשת ויהיו שקוצים כאהבם׃ 10
“Mgbe m chọtara Izrel, ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; mgbe m hụrụ nna nna unu ha, ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
אפרים כעוף יתעופף כבודם מלדה ומבטן ומהריון׃ 11
Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
כי אם יגדלו את בניהם ושכלתים מאדם כי גם אוי להם בשורי מהם׃ 12
A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
אפרים כאשר ראיתי לצור שתולה בנוה ואפרים להוציא אל הורג בניו׃ 13
Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
תן להם יהוה מה תתן תן להם רחם משכיל ושדים צמקים׃ 14
Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
כל רעתם בגלגל כי שם שנאתים על רע מעלליהם מביתי אגרשם לא אוסף אהבתם כל שריהם סררים׃ 15
“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
הכה אפרים שרשם יבש פרי בלי יעשון גם כי ילדון והמתי מחמדי בטנם׃ 16
Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
ימאסם אלהי כי לא שמעו לו ויהיו נדדים בגוים׃ 17
Chineke m ga-ajụ ha, nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.

< הושע 9 >