< יואל 1 >

דבר יהוה אשר היה אל יואל בן פתואל׃ 1
Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Juel nwa Petuel.
שמעו זאת הזקנים והאזינו כל יושבי הארץ ההיתה זאת בימיכם ואם בימי אבתיכם׃ 2
Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye; geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a. Ihe dị otu a o meela na ndụ unu, ka o mere na ndụ nna nna unu ha?
עליה לבניכם ספרו ובניכם לבניהם ובניהם לדור אחר׃ 3
Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
יתר הגזם אכל הארבה ויתר הארבה אכל הילק ויתר הילק אכל החסיל׃ 4
Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
הקיצו שכורים ובכו והיללו כל שתי יין על עסיס כי נכרת מפיכם׃ 5
Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
כי גוי עלה על ארצי עצום ואין מספר שניו שני אריה ומתלעות לביא לו׃ 6
O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
שם גפני לשמה ותאנתי לקצפה חשף חשפה והשליך הלבינו שריגיה׃ 7
Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
אלי כבתולה חגרת שק על בעל נעוריה׃ 8
Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
הכרת מנחה ונסך מבית יהוה אבלו הכהנים משרתי יהוה׃ 9
Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
שדד שדה אבלה אדמה כי שדד דגן הוביש תירוש אמלל יצהר׃ 10
Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
הבישו אכרים הילילו כרמים על חטה ועל שערה כי אבד קציר שדה׃ 11
Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
הגפן הובישה והתאנה אמללה רמון גם תמר ותפוח כל עצי השדה יבשו כי הביש ששון מן בני אדם׃ 12
Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.
חגרו וספדו הכהנים הילילו משרתי מזבח באו לינו בשקים משרתי אלהי כי נמנע מבית אלהיכם מנחה ונסך׃ 13
Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.
קדשו צום קראו עצרה אספו זקנים כל ישבי הארץ בית יהוה אלהיכם וזעקו אל יהוה׃ 14
Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.
אהה ליום כי קרוב יום יהוה וכשד משדי יבוא׃ 15
Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
הלוא נגד עינינו אכל נכרת מבית אלהינו שמחה וגיל׃ 16
Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?
עבשו פרדות תחת מגרפתיהם נשמו אצרות נהרסו ממגרות כי הביש דגן׃ 17
Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
מה נאנחה בהמה נבכו עדרי בקר כי אין מרעה להם גם עדרי הצאן נאשמו׃ 18
Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.
אליך יהוה אקרא כי אש אכלה נאות מדבר ולהבה להטה כל עצי השדה׃ 19
Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
גם בהמות שדה תערוג אליך כי יבשו אפיקי מים ואש אכלה נאות המדבר׃ 20
Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.

< יואל 1 >