< עמוס 6 >

הוי השאננים בציון והבטחים בהר שמרון נקבי ראשית הגוים ובאו להם בית ישראל׃ 1
Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.
עברו כלנה וראו ולכו משם חמת רבה ורדו גת פלשתים הטובים מן הממלכות האלה אם רב גבולם מגבלכם׃ 2
Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?
המנדים ליום רע ותגישון שבת חמס׃ 3
Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
השכבים על מטות שן וסרחים על ערשותם ואכלים כרים מצאן ועגלים מתוך מרבק׃ 4
Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.
הפרטים על פי הנבל כדויד חשבו להם כלי שיר׃ 5
Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
השתים במזרקי יין וראשית שמנים ימשחו ולא נחלו על שבר יוסף׃ 6
Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.
לכן עתה יגלו בראש גלים וסר מרזח סרוחים׃ 7
Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.
נשבע אדני יהוה בנפשו נאם יהוה אלהי צבאות מתאב אנכי את גאון יעקב וארמנתיו שנאתי והסגרתי עיר ומלאה׃ 8
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị, “Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m; ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị. Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”
והיה אם יותרו עשרה אנשים בבית אחד ומתו׃ 9
Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.
ונשאו דודו ומסרפו להוציא עצמים מן הבית ואמר לאשר בירכתי הבית העוד עמך ואמר אפס ואמר הס כי לא להזכיר בשם יהוה׃ 10
Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
כי הנה יהוה מצוה והכה הבית הגדול רסיסים והבית הקטן בקעים׃ 11
Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
הירצון בסלע סוסים אם יחרוש בבקרים כי הפכתם לראש משפט ופרי צדקה ללענה׃ 12
Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume? Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri? Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi, mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
השמחים ללא דבר האמרים הלוא בחזקנו לקחנו לנו קרנים׃ 13
Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba, ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”
כי הנני מקים עליכם בית ישראל נאם יהוה אלהי הצבאות גוי ולחצו אתכם מלבוא חמת עד נחל הערבה׃ 14
“Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile site na Lebo Hamat ruo ndagwurugwu Araba.”

< עמוס 6 >