< תהילים 82 >

מזמור לאסף אלהים נצב בעדת-אל בקרב אלהים ישפט 1
Abụ Ọma Asaf. Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
עד-מתי תשפטו-עול ופני רשעים תשאו-סלה 2
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? (Sela)
שפטו-דל ויתום עני ורש הצדיקו 3
Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
פלטו-דל ואביון מיד רשעים הצילו 4
Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
לא ידעו ולא יבינו-- בחשכה יתהלכו ימוטו כל-מוסדי ארץ 5
Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
אני-אמרתי אלהים אתם ובני עליון כלכם 6
“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
אכן כאדם תמותון וכאחד השרים תפלו 7
Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
קומה אלהים שפטה הארץ כי-אתה תנחל בכל-הגוים 8
O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.

< תהילים 82 >