Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Proverbs Chapter 25 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Proverbs/25 1) Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ. 2) Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu. 3) Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta. 4) Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere; 5) wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume. 6) Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ, 7) ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ 8) e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere? 9) Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru, 10) ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ. 11) Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha. 12) Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya. 13) Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi. 14) Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri. 15) Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ. 16) Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa. 17) Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị. 18) Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi. 19) Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ. 20) Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị. 21) Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ. 22) Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị. 23) Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe. 24) Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 25) Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ. 26) Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya. 27) Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi. 28) Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!