< Habakuk 3 >

1 Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
A prayer of Habakkuk the prophet, according to the Shigionoth.
2 Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
I have heard, Lord, of your fame, I have seen, Lord, your work; through the years you have make yourself known, in wrath you remember mercy.
3 Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. (Sela) Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
God comes from Teman, and the Holy One from the mountain-land of Paran. (Selah) His glory covers the heavens, and his splendour fills the earth.
4 Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
Before him it is like the light, rays he has at his side, where his power is hidden.
5 Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
Before him pestilence stalks, after him plague follows.
6 O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
He stands, and the earth trembles, he looks, and the nations melt away, and the mountains of old are scattered, the everlasting hills bow down. These are his ways from of old.
7 Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
The tents of Cushan are afraid, the curtains of Midian tremble.
8 Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
Is your wrath, Lord, with the rivers? Is your anger against the streams? Or your rage against the sea? Is that why you ride on your war-steeds? Why you mount your chariots of victory?
9 I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. (Sela) I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
Why you bare your bow? Why you fill your quiver with shafts? You split the earth with torrents.
10 Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
The mountains see you and writhe. The tempest of waters sweeps by. The great deep sends forth its voice, and lifts up its hands.
11 Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
The sun forgets to rise. The moon stands still in its place. Your arrows go forth to give light. Your glittering spear is as lightning.
12 I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
In rage you stride over the earth. In wrath you trample the nations.
13 Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
You go forth to save your people. You go to help your anointed. You crush the head of the wicked nation, laying him bare from thigh to neck. (Selah)
14 Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
You pierced his head with his spears, as his champions storm out to scatter us, as they rejoice to devour the poor secretly.
15 Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
You tread the sea with your horses, while the mighty waters roar.
16 Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
I hear, and my body trembles, and at the sound my lips quiver. My bones begin to decay, and my footsteps totter beneath me, while I long for the day of distress to come upon those who attack us.
17 A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
Though the fig tree bears no fruit, and there are no grapes on the vines, though the olive harvest fails, and the fields produce no food, though the flock is cut off from the fold, and there is no herd in the stalls,
18 mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
yet I will exult in the Lord, and rejoice in the God who saves me.
19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.
The Lord God is my strength; he makes my feet as sure as the feet of deer, and causes me to walk on the heights! To the music director: Use stringed instruments.

< Habakuk 3 >