< Nehum 3 >

1 Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.
Woe to the bloody city! Full of lies and plunder, without end is the spoil.
2 Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!
Hear the crack of the whip, hear the rattle of wheels. Galloping horses, jolting chariots.
3 Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe.
Horsemen charging, swords flashing, spears glittering, a multitude of slain, a heap of bodies, no end to the corpses over which people stumble!
4 Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.
‘Because you acted like a whore, bewitching the nations, enticing the peoples,
5 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.
I am against you, Nineveh’ the Lord of hosts declares. ‘I will strip your clothes and show the nations your nakedness, and the kingdoms your shame.
6 Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
‘I will fling loathsome filth at you, and make you an object of contempt, a spectacle,
7 Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
so that everyone who sees you will flee from you and say: “Nineveh is laid waste, who will mourn for her?”
8 Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
‘Are you any better than Thebes, which stood on the banks of the Nile, with waters around as a rampart, whose wall was the sea of waters?
9 Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
Her strength was Ethiopia and Egypt. The Libyans were her helpers, and Put with its countless people.
10 Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
Yet she was exiled and made captive. On all corners of the streets her infants were dashed to pieces. Lots were cast for her nobles, all her great ones were bound in chains.
11 Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.
‘You too, Nineveh, will be drunk with fear; you too will seek a place of escape from the foe.
12 Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.
All your fortresses are fig trees with the first ripe figs; if shaken, they fall into the mouth of the eater!
13 Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.
Your troops are weak as women before your foes; the gates of your land are wide open; your defenses burned down.
14 Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja, rụzikwaa ụlọ ahụ.
‘Draw water for the siege, strengthen your forts. Go to the clay pits and tread the clay; take up the brick moulds.
15 Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube.
There the fire will consume you, the sword will cut you down. Multiply like the locust or a swarm of grasshoppers.
16 Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga
Increase the numbers of your merchants until they are more than the stars of heaven,
17 Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.
until your watchmen are locusts, and your scribes like grasshoppers, which swarm in the hedges on a cold day; but when the sun rises they fly away, no one knows where.
18 Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.
‘King of Assyria: your princes slumber, your nobles sleep! Your people are scattered on the mountains with no one to gather them!
19 Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa. Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị. Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị ga-eji ọṅụ kụọ aka ha, nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?
There is no healing for your hurt, your wound is incurable. All who hear of your fate clap their hands in joy, for who has escaped your limitless cruelty?’

< Nehum 3 >