< 詩篇 26 >

1 大衛的詩。 耶和華啊,求你為我伸冤, 因我向來行事純全; 我又倚靠耶和華,並不搖動。
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ.
2 耶和華啊,求你察看我,試驗我, 熬煉我的肺腑心腸。
Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m.
3 因為你的慈愛常在我眼前, 我也按你的真理而行。
Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
4 我沒有和虛謊人同坐, 也不與瞞哄人的同群。
Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
5 我恨惡惡人的會, 必不與惡人同坐。
Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
6 耶和華啊,我要洗手表明無辜, 才環繞你的祭壇;
Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
7 我好發稱謝的聲音, 也要述說你一切奇妙的作為。
Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
8 耶和華啊,我喜愛你所住的殿 和你顯榮耀的居所。
O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
9 不要把我的靈魂和罪人一同除掉; 不要把我的性命和流人血的一同除掉。
Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
10 他們的手中有奸惡, 右手滿有賄賂。
ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
11 至於我,卻要行事純全; 求你救贖我,憐恤我!
Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere.
12 我的腳站在平坦地方; 在眾會中我要稱頌耶和華!
Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.

< 詩篇 26 >