< 箴言 6 >

1 我兒,你若為朋友作保, 替外人擊掌,
Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe,
2 你就被口中的話語纏住, 被嘴裏的言語捉住。
ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.
3 我兒,你既落在朋友手中, 就當這樣行才可救自己: 你要自卑,去懇求你的朋友。
Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.
4 不要容你的眼睛睡覺; 不要容你的眼皮打盹。
Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.
5 要救自己,如鹿脫離獵戶的手, 如鳥脫離捕鳥人的手。
Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
6 懶惰人哪, 你去察看螞蟻的動作就可得智慧。
Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
7 螞蟻沒有元帥, 沒有官長,沒有君王,
Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,
8 尚且在夏天預備食物, 在收割時聚斂糧食。
ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
9 懶惰人哪,你要睡到幾時呢? 你何時睡醒呢?
Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
10 再睡片時,打盹片時, 抱着手躺臥片時,
Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
11 你的貧窮就必如強盜速來, 你的缺乏彷彿拿兵器的人來到。
ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
12 無賴的惡徒, 行動就用乖僻的口,
Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
13 用眼傳神, 用腳示意, 用指點劃,
onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
14 心中乖僻, 常設惡謀, 布散紛爭。
Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
15 所以,災難必忽然臨到他身; 他必頃刻敗壞,無法可治。
Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
16 耶和華所恨惡的有六樣, 連他心所憎惡的共有七樣:
Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17 就是高傲的眼, 撒謊的舌, 流無辜人血的手,
Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18 圖謀惡計的心, 飛跑行惡的腳,
Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19 吐謊言的假見證, 並弟兄中布散紛爭的人。
onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
20 我兒,要謹守你父親的誡命; 不可離棄你母親的法則,
Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
21 要常繫在你心上, 掛在你項上。
Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.
22 你行走,它必引導你; 你躺臥,它必保守你; 你睡醒,它必與你談論。
Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
23 因為誡命是燈,法則是光, 訓誨的責備是生命的道,
Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
24 能保你遠離惡婦, 遠離外女諂媚的舌頭。
idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
25 你心中不要戀慕她的美色, 也不要被她眼皮勾引。
Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
26 因為,妓女能使人只剩一塊餅; 淫婦獵取人寶貴的生命。
Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
27 人若懷裏搋火, 衣服豈能不燒呢?
Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ?
28 人若在火炭上走, 腳豈能不燙呢?
Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
29 親近鄰舍之妻的,也是如此; 凡挨近她的,不免受罰。
Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
30 賊因飢餓偷竊充飢, 人不藐視他,
Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
31 若被找着,他必賠還七倍, 必將家中所有的盡都償還。
Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
32 與婦人行淫的,便是無知; 行這事的,必喪掉生命。
Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
33 他必受傷損,必被凌辱; 他的羞恥不得塗抹。
A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.
34 因為人的嫉恨成了烈怒, 報仇的時候決不留情。
Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
35 甚麼贖價,他都不顧; 你雖送許多禮物,他也不肯干休。
Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.

< 箴言 6 >