< 箴言 5 >

1 我兒,要留心我智慧的話語, 側耳聽我聰明的言詞,
Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.
2 為要使你謹守謀略, 嘴唇保存知識。
Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.
3 因為淫婦的嘴滴下蜂蜜; 她的口比油更滑,
Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
4 至終卻苦似茵蔯, 快如兩刃的刀。
Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
5 她的腳下入死地; 她腳步踏住陰間, (Sheol h7585)
Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
6 以致她找不着生命平坦的道。 她的路變遷不定, 自己還不知道。
Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
7 眾子啊,現在要聽從我; 不可離棄我口中的話。
Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
8 你所行的道要離她遠, 不可就近她的房門,
Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
9 恐怕將你的尊榮給別人, 將你的歲月給殘忍的人;
ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.
10 恐怕外人滿得你的力量, 你勞碌得來的,歸入外人的家;
Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.
11 終久,你皮肉和身體消毀, 你就悲歎,
Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.
12 說:我怎麼恨惡訓誨, 心中藐視責備,
Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!
13 也不聽從我師傅的話, 又不側耳聽那教訓我的人?
Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.
14 我在聖會裏, 幾乎落在諸般惡中。
Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.”
15 你要喝自己池中的水, 飲自己井裏的活水。
Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
16 你的泉源豈可漲溢在外? 你的河水豈可流在街上?
Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
17 惟獨歸你一人, 不可與外人同用。
Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
18 要使你的泉源蒙福; 要喜悅你幼年所娶的妻。
Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
19 她如可愛的麀鹿,可喜的母鹿; 願她的胸懷使你時時知足, 她的愛情使你常常戀慕。
Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
20 我兒,你為何戀慕淫婦? 為何抱外女的胸懷?
Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
21 因為,人所行的道都在耶和華眼前; 他也修平人一切的路。
Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.
22 惡人必被自己的罪孽捉住; 他必被自己的罪惡如繩索纏繞。
Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.
23 他因不受訓誨就必死亡; 又因愚昧過甚,必走差了路。
Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.

< 箴言 5 >