< 以賽亞書 23 >

1 論泰爾的默示: 他施的船隻都要哀號; 因為泰爾變為荒場, 甚至沒有房屋,沒有可進之路。 這消息是從基提地得來的。
Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.
2 沿海的居民, 就是素來靠航海西頓的商家得豐盛的, 你們當靜默無言。
Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.
3 在大水之上, 西曷的糧食、 尼羅河的莊稼是泰爾的進項; 她作列國的大碼頭。
Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
4 西頓哪,你當慚愧; 因為大海說, 就是海中的保障說: 我沒有劬勞,也沒有生產, 沒有養育男子,也沒有撫養童女。
Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
5 這風聲傳到埃及; 埃及人為泰爾的風聲極其疼痛。
Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.
6 泰爾人哪,你們當過到他施去; 沿海的居民哪,你們都當哀號。
Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
7 這是你們歡樂的城, 從上古而有的嗎? 其中的居民往遠方寄居。
Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
8 泰爾本是賜冠冕的。 她的商家是王子; 她的買賣人是世上的尊貴人。 遭遇如此是誰定的呢?
Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
9 是萬軍之耶和華所定的! 為要污辱一切高傲的榮耀, 使地上一切的尊貴人被藐視。
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
10 他施的民哪, 可以流行你的地,好像尼羅河; 不再有腰帶拘緊你。
Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
11 耶和華已經向海伸手, 震動列國。 至於迦南, 他已經吩咐拆毀其中的保障。
Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
12 他又說:受欺壓西頓的居民哪, 你必不得再歡樂。 起來!過到基提去; 就是在那裏也不得安歇。 (
Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
13 看哪,迦勒底人之地向來沒有這民,這國是亞述人為住曠野的人所立的。現在他們建築戍樓,拆毀泰爾的宮殿,使她成為荒涼。)
Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.
14 他施的船隻都要哀號, 因為你們的保障變為荒場。
Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.
15 到那時,泰爾必被忘記七十年,照着一王的年日。七十年後,泰爾的景況必像妓女所唱的歌:
A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:
16 你這被忘記的妓女啊, 拿琴周流城內, 巧彈多唱,使人再想念你。
“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”
17 七十年後,耶和華必眷顧泰爾,她就仍得利息,與地上的萬國交易。
E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.
18 她的貨財和利息要歸耶和華為聖,必不積攢存留;因為她的貨財必為住在耶和華面前的人所得,使他們吃飽,穿耐久的衣服。
Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

< 以賽亞書 23 >