< 以賽亞書 22 >

1 論異象谷的默示: 有甚麼事使你這滿城的人都上房頂呢?
Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?
2 你這滿處吶喊、大有喧嘩的城, 歡樂的邑啊, 你中間被殺的並不是被刀殺, 也不是因打仗死亡。
Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha.
3 你所有的官長一同逃跑, 都為弓箭手所捆綁。 你中間一切被找到的都一同被捆綁; 他們本是逃往遠方的。
Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.
4 所以我說:你們轉眼不看我, 我要痛哭。 不要因我眾民的毀滅, 就竭力安慰我。
Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”
5 因為主-萬軍之耶和華使「異象谷」 有潰亂、踐踏、煩擾的日子。 城被攻破, 哀聲達到山間。
Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
6 以攔帶着箭袋, 還有坐戰車的和馬兵; 吉珥揭開盾牌。
Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
7 你嘉美的谷遍滿戰車, 也有馬兵在城門前排列。
Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
8 他去掉猶大的遮蓋。 那日,你就仰望林庫內的軍器。
Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
9 你們看見大衛城的破口很多,便聚積下池的水,
Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.
10 又數點耶路撒冷的房屋,將房屋拆毀,修補城牆,
Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.
11 又在兩道城牆中間挖一個聚水池可盛舊池的水,卻不仰望做這事的主,也不顧念從古定這事的。
Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.
12 當那日,主-萬軍之耶和華叫人哭泣哀號, 頭上光禿,身披麻布。
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọrọ unu ụbọchị ahụ ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ, kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.
13 誰知,人倒歡喜快樂, 宰牛殺羊,吃肉喝酒,說: 我們吃喝吧!因為明天要死了。
Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”
14 萬軍之耶和華親自默示我說: 這罪孽直到你們死,斷不得赦免! 這是主-萬軍之耶和華說的。
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
15 主-萬軍之耶和華這樣說:「你去見掌銀庫的,就是家宰舍伯那,對他說:
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna, nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:
16 『你在這裏做甚麼呢?有甚麼人竟在這裏鑿墳墓,就是在高處為自己鑿墳墓,在磐石中為自己鑿出安身之所?
Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?
17 看哪,耶和華必像大有力的人,將你緊緊纏裹,竭力拋去。
“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
18 他必將你滾成一團,拋在寬闊之地,好像拋球一樣。你這主人家的羞辱,必在那裏坐你榮耀的車,也必在那裏死亡。
Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
19 我必趕逐你離開官職;你必從你的原位撤下。』
Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
20 「到那日,我必召我僕人希勒家的兒子以利亞敬來,
“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.
21 將你的外袍給他穿上,將你的腰帶給他繫緊,將你的政權交在他手中。他必作耶路撒冷居民和猶大家的父。
Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.
22 我必將大衛家的鑰匙放在他肩頭上。他開,無人能關;他關,無人能開。
Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi,
23 我必將他安穩,像釘子釘在堅固處;他必作為他父家榮耀的寶座。
Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ.
24 他父家所有的榮耀,連兒女帶子孫,都掛在他身上,好像一切小器皿,從杯子到酒瓶掛上一樣。
A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile.
25 萬軍之耶和華說:當那日,釘在堅固處的釘子必壓斜,被砍斷落地;掛在其上的重擔必被剪斷。因為這是耶和華說的。」
“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.

< 以賽亞書 22 >