< 歷代志下 35 >

1 約西亞在耶路撒冷向耶和華守逾越節。正月十四日,就宰了逾越節的羊羔。
Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ
2 王分派祭司各盡其職,又勉勵他們辦耶和華殿中的事;
O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.
3 又對那歸耶和華為聖、教訓以色列人的利未人說:「你們將聖約櫃安放在以色列王大衛兒子所羅門建造的殿裏,不必再用肩扛抬。現在要事奉耶和華-你們的上帝,服事他的民以色列。
Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.
4 你們應當按着宗族,照着班次,遵以色列王大衛和他兒子所羅門所寫的,自己預備。
Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.
5 要按着你們的弟兄,這民宗族的班次,站在聖所,每班中要利未宗族的幾個人。
“Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.
6 要宰逾越節的羊羔,潔淨自己,為你們的弟兄預備了,好遵守耶和華藉摩西所吩咐的話。」
Gbuonụ atụrụ ngabiga ndị ahụ, doonụ onwe unu nsọ, doziekwaranụ ụmụnna unu ndị Izrel aja ha, ime dịka ihe Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si dị.”
7 約西亞從群畜中賜給在那裏所有的人民,綿羊羔和山羊羔三萬隻,牛三千隻,作逾越節的祭物;這都是出自王的產業中。
Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze.
8 約西亞的眾首領也樂意將犧牲給百姓和祭司利未人;又有管理上帝殿的希勒家、撒迦利亞、耶歇將羊羔二千六百隻,牛三百隻,給祭司作逾越節的祭物。
Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.
9 利未人的族長歌楠雅和他兩個兄弟示瑪雅、拿坦業,與哈沙比雅、耶利、約撒拔將羊羔五千隻,牛五百隻,給利未人作逾越節的祭物。
Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.
10 這樣,供獻的事齊備了。祭司站在自己的地方,利未人按着班次站立,都是照王所吩咐的。
Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.
11 利未人宰了逾越節的羊羔,祭司從他們手裏接過血來灑在壇上;利未人剝皮,
Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.
12 將燔祭搬來,按着宗族的班次分給眾民,好照摩西書上所寫的,獻給耶和華;獻牛也是這樣。
Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.
13 他們按着常例,用火烤逾越節的羊羔。別的聖物用鍋,用釜,用罐煮了,速速地送給眾民。
Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile.
14 然後為自己和祭司預備祭物;因為祭司亞倫的子孫獻燔祭和脂油,直到晚上。所以利未人為自己和祭司亞倫的子孫,預備祭物。
Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.
15 歌唱的亞薩之子孫,照着大衛、亞薩、希幔,和王的先見耶杜頓所吩咐的,站在自己的地位上。守門的看守各門,不用離開他們的職事,因為他們的弟兄利未人給他們預備祭物。
Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.
16 當日,供奉耶和華的事齊備了,就照約西亞王的吩咐守逾越節,獻燔祭在耶和華的壇上。
Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.
17 當時在耶路撒冷的以色列人守逾越節,又守除酵節七日。
Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.
18 自從先知撒母耳以來,在以色列中沒有守過這樣的逾越節,以色列諸王也沒有守過,像約西亞、祭司、利未人、在那裏的猶大人,和以色列人,以及耶路撒冷居民所守的逾越節。
E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.
19 這逾越節是約西亞作王十八年守的。
Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.
20 這事以後,約西亞修完了殿,有埃及王尼哥上來,要攻擊靠近幼發拉底河的迦基米施;約西亞出去抵擋他。
Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.
21 他差遣使者來見約西亞,說:「猶大王啊,我與你何干?我今日來不是要攻擊你,乃是要攻擊與我爭戰之家,並且上帝吩咐我速行,你不要干預上帝的事,免得他毀滅你,因為上帝是與我同在。」
Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”
22 約西亞卻不肯轉去離開他,改裝要與他打仗,不聽從上帝藉尼哥之口所說的話,便來到米吉多平原爭戰。
Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.
23 弓箭手射中約西亞王。王對他的臣僕說:「我受了重傷,你拉我出陣吧!」
Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.”
24 他的臣僕扶他下了戰車,上了次車,送他到耶路撒冷,他就死了,葬在他列祖的墳墓裏。猶大人和耶路撒冷人都為他悲哀。
Ya mere, ha sitere nʼụgbọ agha ya bulie ya bubanye ya nʼime ụgbọ agha ọzọ, bulata ya na Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. E liri ya nʼili nna nna ya ha, ndị Juda na Jerusalem niile ruuru ya uju.
25 耶利米為約西亞作哀歌。所有歌唱的男女也唱哀歌,追悼約西亞,直到今日;而且在以色列中成了定例。這歌載在哀歌書上。
Jeremaya bụụrụ Josaya abụ akwa, ruo taa ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ a iji na-echeta Josaya. Nke a ghọrọ omenaala nʼIzrel, e dekwara ya nʼakwụkwọ abụ akwa dị iche iche.
26 約西亞其餘的事和他遵着耶和華律法上所記而行的善事,
Ihe ndị ọzọ niile Josaya mere, na ọrụ ebere niile ọ rụrụ nʼusoro ihe e dere nʼiwu Onyenwe anyị,
27 並他自始至終所行的,都寫在以色列和猶大列王記上。
na akụkọ ndụ ya site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ka e depụtara nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.

< 歷代志下 35 >