< 歷代志下 34 >

1 約西亞登基的時候年八歲,在耶路撒冷作王三十一年。
Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem.
2 他行耶和華眼中看為正的事,效法他祖大衛所行的,不偏左右。
O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
3 他作王第八年,尚且年幼,就尋求他祖大衛的上帝。到了十二年才潔淨猶大和耶路撒冷,除掉邱壇、木偶、雕刻的像,和鑄造的像。
Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.
4 眾人在他面前拆毀巴力的壇,砍斷壇上高高的日像,又把木偶和雕刻的像,並鑄造的像打碎成灰,撒在祭偶像人的墳上,
Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha.
5 將他們祭司的骸骨燒在壇上,潔淨了猶大和耶路撒冷;
Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha.
6 又在瑪拿西、以法蓮、西緬、拿弗他利各城,和四圍破壞之處,都這樣行;
Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu.
7 又拆毀祭壇,把木偶和雕刻的像打碎成灰,砍斷以色列遍地所有的日像,就回耶路撒冷去了。
O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
8 約西亞王十八年,淨地淨殿之後,就差遣亞薩利雅的兒子沙番、邑宰瑪西雅、約哈斯的兒子史官約亞去修理耶和華-他上帝的殿。
Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya.
9 他們就去見大祭司希勒家,將奉到上帝殿的銀子交給他;這銀子是看守殿門的利未人從瑪拿西、以法蓮,和一切以色列剩下的人,以及猶大、便雅憫眾人,並耶路撒冷的居民收來的。
Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.
10 又將這銀子交給耶和華殿裏督工的,轉交修理耶和華殿的工匠,
Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ.
11 就是交給木匠、石匠,買鑿成的石頭和架木與棟樑,修猶大王所毀壞的殿。
Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa.
12 這些人辦事誠實,督工的是利未人米拉利的子孫雅哈、俄巴底;督催的是哥轄的子孫撒迦利亞、米書蘭;還有善於作樂的利未人。
Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche
13 他們又監管扛抬的人,督催一切做工的。利未人中也有作書記、作司事、作守門的。
ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche.
14 他們將奉到耶和華殿的銀子運出來的時候,祭司希勒家偶然得了摩西所傳耶和華的律法書。
Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.
15 希勒家對書記沙番說:「我在耶和華殿裏得了律法書。」遂將書遞給沙番。
Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan.
16 沙番把書拿到王那裏,回覆王說:「凡交給僕人們辦的都辦理了。
Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị.
17 耶和華殿裏的銀子倒出來,交給督工的和匠人的手裏了。」
Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị nlekọta ọrụ, na ndị ọrụ.”
18 書記沙番又對王說:「祭司希勒家遞給我一卷書。」沙番就在王面前讀那書。
Emesịa, Shefan ode akwụkwọ gwara eze okwu ọzọ sị ya, “O nwere akwụkwọ Hilkaya nyere m.” Shefan wepụtara ya gụọ ya na ntị eze.
19 王聽見律法上的話,就撕裂衣服,
Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.
20 吩咐希勒家與沙番的兒子亞希甘、米迦的兒子亞比頓、書記沙番,和王的臣僕亞撒雅說:
O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
21 「你們去為我、為以色列和猶大剩下的人,以這書上的話求問耶和華;因我們列祖沒有遵守耶和華的言語,沒有照這書上所記的去行,耶和華的烈怒就倒在我們身上。」
“Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke Onyenwe anyị, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.”
22 於是,希勒家和王所派的眾人都去見女先知戶勒大。戶勒大是掌管禮服沙龍的妻,沙龍是哈斯拉的孫子、特瓦的兒子。戶勒大住在耶路撒冷第二區;他們請問於她。
Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
23 她對他們說:「耶和華-以色列的上帝如此說:『你們可以回覆那差遣你們來見我的人說,
Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị
24 耶和華如此說:我必照着在猶大王面前所讀那書上的一切咒詛,降禍與這地和其上的居民;
‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda.
25 因為他們離棄我,向別神燒香,用他們手所做的惹我發怒,所以我的忿怒如火倒在這地上,總不熄滅。』
Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’
26 然而差遣你們來求問耶和華的猶大王,你們要這樣回覆他說:『耶和華-以色列的上帝如此說:至於你所聽見的話,
Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
27 就是聽見我指着這地和其上居民所說的話,你便心裏敬服,在我面前自卑,撕裂衣服,向我哭泣,因此我應允了你。這是我-耶和華說的。
Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
28 我必使你平平安安地歸到墳墓,到你列祖那裏,我要降與這地和其上居民的一切災禍,你也不致親眼看見。』」他們就回覆王去了。
Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
29 王差遣人招聚猶大和耶路撒冷的眾長老來。
Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile.
30 王和猶大眾人,與耶路撒冷的居民,並祭司利未人,以及所有的百姓,無論大小,都一同上到耶和華的殿;王就把殿裏所得的約書念給他們聽。
Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
31 王站在他的地位上,在耶和華面前立約,要盡心盡性地順從耶和華,遵守他的誡命、法度、律例,成就這書上所記的約言;
Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ.
32 又使住耶路撒冷和便雅憫的人都服從這約。於是耶路撒冷的居民都遵行他們列祖之上帝的約。
O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.
33 約西亞從以色列各處將一切可憎之物盡都除掉,使以色列境內的人都事奉耶和華-他們的上帝。約西亞在世的日子,就跟從耶和華-他們列祖的上帝,總不離開。
Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Nʼụbọchị ndụ ya niile, ha esiteghị nʼiso Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna wezuga onwe ha.

< 歷代志下 34 >