< 歷代志上 9 >

1 以色列人都按家譜計算,寫在以色列諸王記上。猶大人因犯罪就被擄到巴比倫。
E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
2 先從巴比倫回來,住在自己地業城邑中的有以色列人、祭司、利未人、尼提寧的首領。
Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
3 住在耶路撒冷的有猶大人、便雅憫人、以法蓮人、瑪拿西人。
Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
4 猶大兒子法勒斯的子孫中有烏太。烏太是亞米忽的兒子;亞米忽是暗利的兒子;暗利是音利的兒子;音利是巴尼的兒子。
Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
5 示羅的子孫中有長子亞帥雅和他的眾子。
Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
6 謝拉的子孫中有耶烏利和他的弟兄,共六百九十人。
Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu.
7 便雅憫人中有哈西努的曾孫、何達威雅的孫子、米書蘭的兒子撒路,
Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
8 又有耶羅罕的兒子伊比尼雅,米基立的孫子、烏西的兒子以拉,伊比尼雅的曾孫、流珥的孫子、示法提雅的兒子米書蘭,
na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
9 和他們的族弟兄,按着家譜計算共有九百五十六名。這些人都是他們的族長。
Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii.
10 祭司中有耶大雅、耶何雅立、雅斤,
Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;
11 還有管理上帝殿希勒家的兒子亞薩利雅。希勒家是米書蘭的兒子;米書蘭是撒督的兒子;撒督是米拉約的兒子;米拉約是亞希突的兒子。
Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.
12 有瑪基雅的曾孫、巴施戶珥的孫子、耶羅罕的兒子亞大雅,又有亞第業的兒子瑪賽;亞第業是雅希細拉的兒子;雅希細拉是米書蘭的兒子;米書蘭是米實利密的兒子;米實利密是音麥的兒子。
Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea
13 他們和眾弟兄都是族長,共有一千七百六十人,是善於做上帝殿使用之工的。
Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii. Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.
14 利未人米拉利的子孫中,有哈沙比雅的曾孫、押利甘的孫子、哈述的兒子示瑪雅。
Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
15 有拔巴甲、黑勒施、迦拉,並亞薩的曾孫、細基利的孫子、米迦的兒子瑪探雅,
Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
16 又有耶杜頓的曾孫、迦拉的孫子、示瑪雅的兒子俄巴底,還有以利加拿的孫子、亞撒的兒子比利家。他們都住在尼陀法人的村莊。
Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
17 守門的是沙龍、亞谷、達們、亞希幔,和他們的弟兄;沙龍為長。
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
18 從前這些人看守朝東的王門,如今是利未營中守門的。
Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
19 可拉的曾孫、以比雅撒的孫子、可利的兒子沙龍,和他的族弟兄可拉人都管理使用之工,並守會幕的門。他們的祖宗曾管理耶和華的營盤,又把守營門。
Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
20 從前以利亞撒的兒子非尼哈管理他們,耶和華也與他同在。
Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
21 米施利米雅的兒子撒迦利雅是看守會幕之門的。
Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
22 被選守門的人共有二百一十二名。他們在自己的村莊,按着家譜計算,是大衛和先見撒母耳所派當這緊要職任的。
Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ. E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
23 他們和他們的子孫按着班次看守耶和華殿的門,就是會幕的門。
Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
24 在東西南北,四方都有守門的。
Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
25 他們的族弟兄住在村莊,每七日來與他們換班。
Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
26 這四個門領都是利未人,各有緊要的職任,看守上帝殿的倉庫。
Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
27 他們住在上帝殿的四圍,是因委託他們守殿,要每日早晨開門。
Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
28 利未人中有管理使用器皿的,按着數目拿出拿入;
Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
29 又有人管理器具和聖所的器皿,並細麵、酒、油、乳香、香料。
Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
30 祭司中有人用香料做膏油。
Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
31 利未人瑪他提雅是可拉族沙龍的長子,他緊要的職任是管理盤中烤的物。
Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
32 他們族弟兄哥轄子孫中,有管理陳設餅的,每安息日預備擺列。
Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.
33 歌唱的有利未人的族長,住在屬殿的房屋,晝夜供職,不做別樣的工。
Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
34 以上都是利未人著名的族長,住在耶路撒冷。
Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
35 在基遍住的有基遍的父親耶利。他的妻名叫瑪迦;
Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
36 他長子是亞伯頓。他又生蘇珥、基士、巴力、尼珥、拿答、
Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
37 基多、亞希約、撒迦利雅、米基羅。
Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.
38 米基羅生示米暗。這些人和他們的弟兄在耶路撒冷對面居住。
Miklot bụ nna Shimeam. Ha onwe ha sokwa ụmụnna ha biri na Jerusalem.
39 尼珥生基士;基士生掃羅;掃羅生約拿單、麥基舒亞、亞比拿達、伊施‧巴力。
Nea mụrụ Kish nna Sọl, onye bụ nna Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
40 約拿單的兒子是米力‧巴力;米力‧巴力生米迦。
Jonatan mụrụ Merib-Baal nna Maịka.
41 米迦的兒子是毗敦、米勒、他利亞、亞哈斯。
Maịka mụrụ Piton, Melek, Tahrea na Ehaz.
42 亞哈斯生雅拉;雅拉生亞拉篾、亞斯瑪威、心利;心利生摩撒;
Ehaz mụrụ Jada. Jada bụ nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
43 摩撒生比尼亞;比尼亞生利法雅;利法雅的兒子是以利亞薩;以利亞薩的兒子是亞悉。
Moza mụrụ Binea, nna Refaya, nna Eleasa, nna Azel.
44 亞悉有六個兒子,他們的名字是亞斯利干、波基路、以實瑪利、示亞利雅、俄巴底雅、哈難。這都是亞悉的兒子。
Azel mụrụ ụmụ isii: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.

< 歷代志上 9 >