< До римлян 7 >

1 Чи ви не знаєте, браття, — бо говорю́ тим, хто знає Закона, — що Зако́н панує над люди́ною, поки вона живе?
Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya?
2 Бо замі́жня жінка, поки живе чоловік, прив'язана до нього Законом; а коли помре чоловік, вона звільняється від закону чоловіка.
Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.
3 Тому то, поки живе чоловік, вона буде вважатися перелю́бницею, якщо стане дружи́ною іншому чоловікові; коли ж чоловік помре, вона вільна від Зако́ну, і не буде перелю́бницею, якщо стане за дружи́ну іншому чоловікові.
A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.
4 Так, мої браття, і ви вмерли для Зако́ну через тіло Христове, щоб належати вам іншому, Воскре́слому з мертвих, щоб прино́сити плід Богові.
Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.
5 Бо коли ми жили за ті́лом, то при́страсті гріховні, що похо́дять від Закону, ді́яли в наших членах, щоб прино́сити плід смерти.
Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.
6 А тепер ми звільни́лись від Закону, умерши для того, чим були зв'язані, щоб служити нам обно́вленням духа, а не старістю букви.
Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.
7 Що ж скажемо? Чи Зако́н — то гріх? Зо́всім ні! Але я не пізнав гріха, як тільки через Зако́н, бо я не знав би пожадливости, коли б Закон не наказував: „Не пожада́й“.
Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.
8 Але гріх, узявши при́від від заповіді, зробив у мені всяку пожадливість, бо без Закону гріх мертвий.
Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị.
9 А я колись жив без Закону, але, коли прийшла заповідь, то гріх ожив,
Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute.
10 а я вмер; і сталася мені та заповідь, що для життя, на смерть,
Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ.
11 бо гріх, узявши причину від заповіді, звів мене, і нею вмертви́в.
Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m.
12 Тому́ то Зако́н святий, і заповідь свята, і праведна, і добра.
Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.
13 Тож чи добре стало мені смертю? Зо́всім ні! Але гріх, щоб стати гріхом, приніс мені смерть добром, щоб гріх став мі́цно грі́шний через за́повідь.
Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
14 Бо ми знаємо, що Зако́н духовний, а я тіле́сний, про́даний під гріх.
Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.
15 Бо що́ я виконую, не розумію; я бо чиню не те, що́ хочу, але що́ нена́виджу, те я роблю́.
O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.
16 А коли роблю́ те, чого я не хо́чу, то згоджуюсь із Законом, що він добрий,
Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
17 а тому вже не я це виконую, але гріх, що живе в мені.
Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
18 Знаю бо, що не живе в мені, цебто в тілі моїм, добре; бо бажа́ння лежить у мені, але щоб виконати добре, того не знахо́джу.
O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
19 Бо не роблю́ я доброго, що хочу, але зле, чого не хочу, це чиню.
Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
20 Коли ж я роблю́ те, чого не хочу, то вже не я це виконую, але гріх, що живе в мені.
Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
21 Тож знахо́джу зако́на, коли хочу робити добро, — що зло лежить у мені.
Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime.
22 Бо маю задово́лення в Законі Божому за вну́трішнім чолові́ком,
Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.
23 та бачу інший зако́н у членах своїх, що воює проти закону мого розуму, і поло́нить мене законом гріховним, що знахо́диться в членах моїх.
Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.
24 Нещасна я люди́на! Хто мене ви́зволить від тіла цієї смерти?
Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?
25 Дякую Богові через Ісуса Христа, Господа нашого. Тому́ то я сам служу́ розумом Законові Божому, але тілом — закону гріховному.
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.

< До римлян 7 >