< Від Матвія 21 >

1 А коли вони набли́зились до Єрусалиму, і прийшли до Вітфагі́ї, до гори до Оли́вної, тоді Ісус вислав двох учнів,
Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
2 до них, кажучи: „Ідіть у село, яке перед вами, і зна́йдете зараз ослицю прив'язану та з нею осля́; відв'яжіть, і Мені приведіть їх.
Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha.
3 А як хто вам що́ скаже, відкажіть, що їх потребує Госпо́дь, — і він зараз пошле їх“.
Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.”
4 А це сталось, щоб спра́вдилось те, що сказав був пророк, промовляючи:
E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.
5 „Скажіте Сіонській доньці́: Ось до тебе йде Цар твій! Він покі́рливий, і всів на осла, — на осля, під'яре́мної сина“.
“Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’”
6 А учні пішли та й зробили, як звелів їм Ісус.
Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee.
7 Вони привели́ до Ісуса ослицю й осля́, і одежу поклали на них, — і Він сів на них.
Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha.
8 І багато народу стелили одежу свою по дорозі, інші ж різали віття з дерев і стели́ли дорогою.
Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya.
9 А наро́д, що йшов перед Ним і поза́ду, викрикував, кажучи: „Оса́нна Сину Давидовому! Благословенний, хто йде у Господнє Ім'я́! Осанна на висоті!“
Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
10 А коли увійшов Він до Єрусалиму, то здвигнулося ціле місто, питаючи: „Хто́ це такий?“
Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?”
11 А наро́д говорив: „Це Пророк, — Ісус із Назаре́ту Галілейського!“
Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.”
12 Потому Ісус увійшов у храм Божий, і вигнав усіх продавців і покупців у храмі, і попереверта́в грошомінам столи, та осло́ни — продавцям голубів.
Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.
13 І сказав їм: „Написано: „Дім Мій — буде домом молитви, “а ви робите з нього „печеру розбійників“.
Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’”
14 I приступили у храмі до Нього сліпі та криві, — і Він їх уздоро́вив.
Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.
15 А первосвященики й книжники, бачивши чуда, що Він учинив, і дітей, що в храмі викрикували: „Осанна Сину Давидовому“, обурилися,
Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.
16 та й сказали Йому: „Чи ти чуєш, що кажуть вони?“А Ісус відказав їм: „Так. Чи ж ви не читали нікол́и: „Із уст немовлят, і тих, що ссуть, учинив Ти хвалу“?
Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?”
17 І покинувши їх, Він вийшов за місто в Віфа́нію, — і там ніч перебув.
Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.
18 А вранці, до міста вертаючись, Він зголоднів.
Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
19 І побачив Він при дорозі одне фі́ґове дерево, і до нього прийшов, та нічого, крім листя само́го, на нім не знайшов. І до нього Він каже: „Нехай пло́ду із тебе не буде ніко́ли повіки!“І фіґове дерево зараз усохло. (aiōn g165)
Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. (aiōn g165)
20 А учні, побачивши це, дивувалися та говорили: „Як швидко всохло це фіґове дерево!“
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”
21 Ісус же промовив у відповідь їм: „Поправді кажу́ вам: Коли б мали ви віру, і не мали су́мніву, то вчинили б не тільки як із фіговим деревом, а якби й цій горі ви сказали: „Порушся та кинься до моря“, — то й станеться те!
Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa.
22 І все, чого ви в молитві попросите з вірою, — то одержите“.
Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”
23 А коли Він прийшов у храм і навчав, поприхо́дили первосвященики й старші наро́ду до Нього й сказали: „Якою Ти вла́дою чиниш оце? І хто Тобі вла́ду цю дав?“
Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”
24 Ісус же промовив у відповідь їм: „Запитаю й Я вас одне слово. Як про нього дасте Мені відповідь, то й Я вам скажу́, якою вла́дою Я це чиню́.
Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile.
25 Іванове хрищення звідки було: із неба, чи від людей?“Вони ж міркували собі й говорили: „Коли скажемо: „Із неба“, відкаже Він нам: „Чого ж ви йому не повірили?“
Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
26 А як скажемо: „Від людей“, — боїмося наро́ду, бо Івана вважають усі за пророка“.
Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.”
27 І сказали Ісусові в відповідь: „Ми не знаємо“. Відказав їм і Він: „То й Я вам не скажу́, якою владою Я це чиню́.
Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.
28 А як вам здається? Один чоловік мав двох синів. Прийшовши до першого, він сказав: „Піди но, дитино, сьогодні, працюй у винограднику!“
“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’
29 А той відповів і сказав: „Готовий, панотче“, — і не пішов.
“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ.
30 І, прийшовши до другого, так само сказав. А той відповів і сказав: „Я не хочу“. А потім покаявся, і пішов.
“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị.
31 Котрий же з двох учинив волю батькову?“Вони кажуть: „Останній“. Ісус промовляє до них: „Поправді кажу вам, що ми́тники та блудоді́йки випере́джують вас у Боже Царство.
“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke.
32 Бо прийшов був до вас дорогою праведности Іван, та йому не повірили ви, а ми́тники та блудоді́йки йняли йому віри. А ви бачили, та проте не покаялися й опісля́, щоб повірити йому.
Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.
33 Послухайте іншої притчі. Був госпо́дар один. Насадив виноградника він, обгородив його муром, ви́довбав у ньому чави́ло, башту поставив, — і віддав його винаря́м, та й пішов.
“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ.
34 Коли ж надійшов час плоді́в, він до винарів послав рабів своїх, щоб прийняти плоди́ свої.
Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ.
35 Винарі ж рабів його похапали, — і одно́го побили, а другого замордували, а того вкаменува́ли.
“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume.
36 Знов послав він інших рабів, більш як перше, — та й їм учинили те саме.
Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ.
37 Нарешті послав до них сина свого́ і сказав: „Посоро́мляться сина мого“.
Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’
38 Але́ винарі́, як побачили сина, міркувати собі стали: „Це спадкоє́мець; ходім, замордуймо його, — і заберемо його спа́дщину!“
“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’
39 І, схопи́вши його, вони вивели за виноградник його, та й убили.
Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ.
40 Отож, як прибу́де той пан виноградника, що́ зробить він тим винаря́м?“
“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”
41 Вони кажуть Йому: „Злочинців погубить жорсто́ко, виноградника ж віддасть іншим винаря́м, що будуть плоди́ віддавати йому своєча́сно“.
Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.”
42 Ісус промовляє до них: „Чи ви не читали ніко́ли в Писа́нні: Камінь, що його будівничі відкинули, — той наріжним став каменем; від Господа сталося це, і дивне воно в очах наших!“
Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’
43 Тому́ кажу вам, що від вас Царство Боже відійметься, і дасться наро́дові, що плоди́ його буде прино́сити.
“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
44 І хто впаде́ на цей камінь — розі́б'ється, а на кого він сам упаде — то розча́вить його́“.
Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.”
45 А як первосвященики та фарисеї почули ці притчі Його, то вони зрозуміли, що про них Він гово́рить.
Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha.
46 І намага́лись схопи́ти Його, але́ побоялись людей, бо вважали Його за Пророка.
Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.

< Від Матвія 21 >