< Від Івана 18 >

1 Промовивши це, Ісус вийшов із учнями Своїми на то́й бік потоку Кедро́ну, де був сад, до якого ввійшов Він та учні Його.
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.
2 Але й Юда, що видав Його, знав те місце, бо там часто збирались Ісус й Його учні.
Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge.
3 Отож Юда, узявши відділ ві́йська та службу від первосвящеників і фарисеїв, приходить туди із смолоски́пами, та з ліхтарями, та з зброєю.
Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.
4 А Ісус, усе ві́давши, що́ з Ним статися має, виходить та й каже до них: „Кого́ ви шукаєте?“
Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?”
5 Йому відповіли: „Ісуса Назаряни́на“. Він говорить до них: „Це Я“! А стояв із ними й Юда, що видав Його.
Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.)
6 I як тільки сказав їм: „Це Я“, вони подали́ся назад, та й на землю попа́дали.
Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala.
7 І Він знов запитав їх: „Кого́ ви шукаєте?“Вони ж відказали: „Ісуса Назаряни́на“.
Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”
8 Ісус відповів: „Я сказав вам, що це Я. Отож, як Мене ви шукаєте, то дайте оцим відійти “, —
Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.”
9 щоб збулося те слово, що Він був сказав: „Я не втратив ніко́го із тих, кого дав Ти Мені“.
Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.”
10 Тоді Си́мон Петро, меча мавши, його ви́хопив, і рубону́в раба́ первосвященика, — і відтя́в праве́ вухо йому́. А рабу́ на ім'я́ було Малх.
Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus.
11 Та промовив Ісус до Петра: Всунь у пі́хви меча! Чи ж не мав би Я пити ту чашу, що Отець дав Мені?“
Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”
12 Відділ же війська та тисяцький і служба юдейська схопи́ли Ісуса, і зв'язали Його,
Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ.
13 і повели Його перше до Анни, бо тестем доводивсь Кайяфі, що первосвящеником був того року.
Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ.
14 Це ж був той Кайя́фа, що порадив юдеям, що ліпше померти люди́ні одній за наро́д.
Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile.
15 А Симон Петро й інший учень ішли за Ісусом слідо́м. Той же учень відо́мий був первосвященикові, і ввійшов у двір первосвящеників із Ісусом.
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.
16 А Петро за ворітьми стояв. Тоді вийшов той учень, що відо́мий був первосвященикові, і сказав ворота́рці, — і впровадив Петра.
Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.
17 І питає Петра ворота́рка служни́ця: „Ти хіба не з учнів Цього Чоловіка?“Той відказує: „Ні!“
Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”
18 А раби й служба, розклавши огонь, стояли та й грілися, бо був холод. І Петро стояв із ними та грівся.
Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
19 А первосвященик спитався Ісуса про учнів Його, і про науку Його.
Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya.
20 Ісус Йому відповідь дав: „Я світові явно казав. Я постійно навчав у синагозі й у храмі, куди всі юдеї збираються, а таємно нічо́го Я не говорив.
Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.
21 Чого ти питаєш Мене? Поспитайся тих, що чули, що́ Я їм говорив. Отже, знають вони, про що Я говорив“.
Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”
22 А як Він це сказав, то один із присутньої там служби вдарив Ісуса в щоку́, говорячи: „То так відповідаєш первосвященикові?“
Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?”
23 Ісус йому відповідь дав: „Якщо зле Я сказав, — покажи, що то зле; коли ж добре, — за що́ Мене б'єш?“
Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.”
24 І відіслав Його Анна зв'язаним первосвященикові Кайяфі.
Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
25 А Си́мон Петро стояв, гріючись. І сказали до нього: „Чи й ти не з учнів Його?“Він відрікся й сказав: „Ні!“
Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”
26 Говорить один із рабів первосвященика, родич тому́, що йому Петро вухо відтя́в: „Чи тебе я не бачив у саду́ з Ним?“
Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?”
27 І зно́ву відрікся Петро, — і заспівав півень хвилі тієї.
Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
28 А Ісуса ведуть від Кайяфи в прето́рій. Був же ра́нок. Та вони не ввійшли до прето́рія, щоб не опога́нитись, а щоб їсти пасху.
Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.
29 Тоді вийшов Пилат назо́вні до них і сказав: „Яку ска́ргу приносите ви на Цього Чоловіка?“
Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?”
30 Вони відповіли та й сказали йому: „Коли́ б Цей злочи́нцем не був, ми б Його тобі не видавали“.
Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.”
31 А Пилат їм сказав: „Візьміть Його, та й за вашим Зако́ном судіть Його“. Юдеї сказали йому: „Нам не вільно нікого вбивати“, —
Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.”
32 щоб збулося Ісусове слово, що його Він прорік, зазначаючи, якою то смертю Він має померти.
Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ.
33 Тоді зно́ву Пилат увійшов у прето́рій, і покликав Ісуса, і до Нього сказав: „Чи Ти Цар Юдейський?“
Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?”
34 Ісус відповів: „Чи від себе самого питаєш ти це, чи то інші тобі говорили про Мене?“
Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?”
35 Пилат відповів: „Чи ж юде́янин я? Твій наро́д та первосвященики мені Тебе видали. Що таке Ти вчинив?“
Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?”
36 Ісус відповів: „Моє Царство не із світу цього́. Якби із цього світу було́ Моє Царство, то служба Моя́ воювала б, щоб не ви́даний був Я юдеям. Та тепер Моє Царство не звідси“.
Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.”
37 Сказав же до Нього Пила́т: „Так Ти Цар?“Ісус відповів: „Сам ти кажеш, що Цар Я. Я на те народився, і на те прийшов у світ, щоб засві́дчити правду. І кожен, хто з правди, той чує Мій голос“.
Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
38 Говорить до Нього Пила́т: „Що є правда?“І сказавши оце, до юдеїв знов вийшов, та й каже до них: „Не знахо́джу Я в Ньому провини нія́кої.
Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya.
39 Та ви маєте зви́чай, щоб я випустив вам одно́го на Пасху. Чи хочете отже, — відпущу́ вам Царя Юдейського?“
Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
40 Та зно́ву вони зняли крик, вимагаючи: „Не Його, а Вара́вву!“А Вара́вва був злочи́нець.
Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.

< Від Івана 18 >