< До галатів 6 >

1 Браття, як люди́на й упаде́ в якій про́гріх, то ви, духовні, виправляйте такого духом ла́гідности, сам себе доглядаючи, щоб не спокусився й ти!
Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
2 Носіть тягарі́ один о́дного, і так виконаєте зако́на Христового.
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
3 Коли бо хто ду́має, що він що́сь, бувши ніщо́, сам себе той обманює.
Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
4 Нехай кожен досліджує ді́ло своє, і тоді матиме тільки в собі похвалу́, а не в іншому!
Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
5 Бо кожен не́стиме свій власний тяга́р!
Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
6 А хто сло́ва навчається, нехай ділиться всяким добром із навчаючим.
Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
7 Не обманюйтеся, — Бог осміяний бути не може. Бо що тільки люди́на посіє, те саме й пожне!
Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
8 Бо хто сіє для власного тіла свого, той від тіла тління пожне. А хто сіє для Духа, той від Духа пожне життя вічне. (aiōnios g166)
Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
9 А роблячи добре, не зну́джуймося, бо ча́су свого пожнемо́, коли не ослабнемо.
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
10 Тож тому́, поки маємо час, усім робімо добро, а найбільш одновірним!
Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
11 Погляньте, якими великими буквами я написав вам своєю рукою!
Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
12 Усі ті, хто бажає хвалитися тілом, змушують вас обрізуватись, щоб тільки вони не були переслідувані за хреста Христового.
Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
13 Бо навіть і ті, хто обрізується, самі не зберігають Зако́на, а хочуть, щоб ви обрізувались, щоб хвалитися їм вашим тілом.
Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
14 А щодо мене, то нехай нічим не хвалюся, хіба тільки хрестом Господа нашого Ісуса Христа, що ним розп'я́тий світ для мене, а я для світу.
Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
15 Бо сили немає ані обрі́зання, ані необрізання, а створі́ння нове́.
Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
16 А всі ті, хто пі́де за цим пра́вилом, — мир та милість на них, і на Ізраїля Божого!
Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
17 Зре́штою, хай ніхто не турбує мене, бо ношу́ я Ісусові рани на тілі своїм!
Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
18 Благодать Господа нашого Ісуса Христа нехай буде з духом вашим, браття! Амі́нь.
Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.

< До галатів 6 >