< Дії 17 >

1 Як вони перейшли Амфіпо́ль й Аполло́нію, то прийшли до Солу́ня, де була синагога юдейська.
Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
2 І Павло, за звича́єм своїм, до них увійшов, і з ними змагавсь три суботи з Писа́ння,
Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ,
3 виказуючи та доводячи, що мусів Христос постраждати й воскре́снути з мертвих, і що Христос Той — Ісус, про Якого „я вам проповідую“.
na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”
4 І ввірували дехто з них і до Павла та до Сили пристали, — безліч побожних із ге́лленів та немало з шляхе́тних жінок.
Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
5 А невірні юдеї були запалилися за́здрістю, і якихсь негідних людей назбирали на вулицях, учинили збіго́висько та й бунтували те місто, а набі́гши на хату Ясо́нову, шукали апо́столів, щоб до на́товпу вивести їх.
Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.
6 А як їх не знайшли, потягли до начальників міста Ясо́на та декого з братті, кричачи́: „Ті, що світ сколотили, — і сюди ось вони поприхо́дили!
Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
7 А Ясон їх до себе прийняв. Вони всі проти наказів кесаря чинять, гово́рячи, ніби інший є цар — Ісус“.
Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
8 І вони зворохо́били наро́д та начальників міста, що слухали це.
Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
9 Але, узявши поруку з Ясо́на та з інших, вони їх відпустили.
Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
10 А брати відіслали негайно вночі Павла й Силу до Ве́рії. І, прибувши, вони пішли в синагогу юдейську.
Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
11 Ці були шляхетні́ші за солу́нян, — і слова́ прийняли з повним за́палом, і Писа́ння досліджували день-у-день, чи та́к воно є.
Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.
12 Тож багато із них тоді ввірували, і з почесних ге́лленсьих жінок та немало із му́жів.
Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.
13 Як солунські ж юдеї довідалися, що Павло проповідує Боже Слово й у Ве́рії, прибули́ вони, і там баламутили та бунтували наро́д.
Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara.
14 Тоді браття негайно Павла відпустили, щоб до моря йшов; а Сила та Тимофій позоста́лися там.
Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.
15 А ті, що Павла́ відпроваджували, провели́ його аж до Ате́н, а прийнявши нака́за про Силу та Тимофія, щоб до нього вернулися якнайшвидше, відбули́.
Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
16 Як Павло ж їх чекав у в Ате́нах, у ньо́му кипів його дух, як бачив це місто, повне ідолів.
Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.
17 Тож він розмовляв у синагозі з юдеями та з богобійними, і на ринку щоденно зі стрі́чними.
Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.
18 А дехто з філо́софів епікуре́їв та сто́їків сперечалися з ним. Одні говорили: „Що́ то хоче сказати оцей пустомо́в?“А інші: „Здається, він проповідник чужих богів“, бо він їм звіща́в Єва́нгелію про Ісуса й воскре́сення.
Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.
19 І, взявши його, повели в ареопа́г та й казали: „Чи можемо знати, що́ то є ця наука нова́, яку проповідуєш ти?
Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a?
20 Бо чудне́ щось вкладаєш до наших вух. Отже хочемо знати, що́ то значити має?“
Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.”
21 А всі ате́няни та захожі чужи́нці нічим іншим радніш не займалися, як аби щось нове́ говорити чи слухати.
(Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.)
22 Тоді Павло став посе́редині ареопа́гу й промовив: „Му́жі ате́нські! Із усьо́го я бачу, що ви дуже побожні.
Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
23 Бо, проходячи та оглядаючи свя́тощі ваші, я знайшов також же́ртівника, що на ньому написано: „Незнаному Богові“. Ось Того, Кого навмання́ ви шануєте, Того я проповідую вам.
Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.
24 Бог, що створив світ і все, що в ньому, бувши Господом неба й землі, проживає не в хра́мах, рукою збудова́них,
“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
25 і Він не вимагає служі́ння рук лю́дських, ніби в чо́мусь Він мав би потребу, бо Сам дає всім і життя, і дихання, і все.
Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.
26 І ввесь лю́дський рід Він з одно́го створив, щоб замешкати всю поверхню землі, і призна́чив окреслені до́би й границі заме́шкання їх,
O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.
27 щоб Бога шукали вони, чи Його не відчують і не зна́йдуть, хоч Він недалеко від кожного з нас.
Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya.
28 Бо ми в Нім живемо́, і рухаємось, і існуємо, як і деякі з ваших поетів казали: „Навіть рід ми Його!“
‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’
29 Отож, бувши Божим тим родом, не повинні ми ду́мати, що Божество́ подібне до золота, або срі́бла, чи до каменю, твору мистецтва чи лю́дської ви́гадки.
“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.
30 Не зважаючи ж Бог на часи невідо́мости, ось тепер усім лю́дям наказує, щоб скрізь ка́ялися,
Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
31 бо Він ви́значив день, коли хоче судити поправді ввесь світ через Мужа, що Його наперед Він поставив, і Він подав до́каза всім, із мертвих Його воскресивши“.
Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
32 Як почули ж вони про воскре́сення мертвих, то одні насміхатися стали, а інші казали: „Про це бу́демо слухати тебе іншим ра́зом“.
Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
33 Так вийшов Павло з-поміж них.
Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
34 А деякі мужі пристали до нього й увірували, серед них і Діонисій Ареопагі́т, і жінка, Дама́ра ім'я́м, та інші із ними.
Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.

< Дії 17 >