< 2 Петра 1 >

1 Симеон Петро, раб та апо́стол Ісуса Христа, до тих, хто одержав із нами рівноці́нну віру в праведності Бога нашого й Спасителя Ісуса Христа:
Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
2 благодать вам та мир нехай примно́житься в пізна́нні Бога й Ісуса, Господа нашого!
Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
3 Усе, що потрібне для життя та побожности, подала́ нам Його Божа сила пізна́нням Того, Хто покликав нас славою та чесно́тою.
O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
4 Через них даро́вані нам цінні та великі обі́тниці, щоб ними ви стали уча́сниками Божої Істо́ти, утікаючи від пожадливого світового тління.
O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
5 Тому́ докладіть до цього всю пильність, і покажіть у вашій вірі чесно́ту, а в чесно́ті — пізна́ння,
Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,
6 а в пізнанні — стри́мання, а в стри́манні — терпеливість, а в терпеливості — благоче́стя,
tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.
7 а в благочесті — брате́рство, а в братерстві — любов.
Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.
8 Бо коли це в вас є та примно́жується, то воно зробить вас нелінивими, ані безплідними для пізна́ння Господа нашого Ісуса Христа.
Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9 А хто цього не має, той сліпий, короткозо́рий, він забув про очи́щення з своїх давніх гріхів.
Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.
10 Тому́, браття, тим більше дба́йте чинити міцни́м своє покли́кання та ви́брання, бо, ро́блячи так, ви ніко́ли не спіткне́тесь.
Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
11 Бо щедро відкриється вам вхід до вічного Царства Господа нашого й Спасителя Ісуса Христа. (aiōnios g166)
Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. (aiōnios g166)
12 Тому то ніко́ли я не зане́дбую про це вам нагадувати, хоч ви й знаєте, і впе́внені в тепе́рішній правді.
Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.
13 Бо вважаю я за справедливе, доки я в цій оселі, спону́кувати вас нага́дуванням,
Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.
14 знаючи, що я незаба́ром повинен покинути оселю свою, як і Госпо́дь наш Ісус Христос об'явив мені.
Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.
15 А я пильнуватиму, щоб ви й по моє́му відхо́ді за́вжди мали це в пам'яті.
Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
16 Бо ми сповістили вам силу та прихід Господа нашого Ісуса Христа, не йдучи за хитро видуманими байка́ми, але бувши самови́дцями Його ве́личі.
Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
17 Бо Він честь та славу прийняв від Бога Отця, як до Нього прийшов від величної слави голос такий: „Це Син Мій Улю́блений, що Його Я вподо́бав!“
Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
18 І цей голос, що з неба зійшов, ми чули, як із Ним були на святій горі.
Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
19 І ми маємо слово пророче певніше. І ви добре робите, що на нього вважаєте, як на світильника, що світить у темному місці, аж поки зачне розвидня́тися, і світова́ зірни́ця засяє у ваших серцях,
Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
20 бо ви знаєте перше про те, що жодне проро́цтво в Писа́нні від власного ви́яснення не залежить.
Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
21 Бо проро́цтва ніко́ли не було з волі лю́дської, а звіщали його святі Божі му́жі, прова́джені Духом Святим.
Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.

< 2 Петра 1 >