< 2 до коринтян 7 >

1 Отож, мої любі, мавши ці обі́тниці, очистьмо себе від усякої не́чисти тіла та духа, — і творімо святиню у Божім страху́!
Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
2 Дайте місце для нас! Ми ніко́го не скривдили, ніко́го не зіпсували, нікого не ошука́ли!
Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu.
3 Говорю́ не на о́суд, бо я перед тим був сказав, що ви в серцях наших, щоб нам із вами чи померти чи жити.
Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu.
4 У мене велика сміли́вість до вас, велика мені похвала́ з вас, я повний потіхи, збагачаюся радістю при всякому нашому горі.
Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.
5 Бо коли ми прийшли в Македо́нію, тіло наше не мало спочинку нія́кого, у всьому бідуючи: назовні — бої, страхіття — всере́дині.
Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.
6 Але Бог, що тішить прини́жених, потішив нас при́ходом Тита,
Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs.
7 і не тільки його прибуття́м, а й поті́шенням, що ним він потішився з вас, коли розповідав нам про вашу журбу́, про ваш смуток, про вашу горли́вість до мене, так що я більше тішився.
Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
8 Коли я й засмутив вас листом, то не каюся, хоч і каявся був, бо бачу, що той лист засмутив вас, хоч і часово.
Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta.
9 Я радію тепер не тому́, що ви засмутились, а що ви засмутилися на покая́ння, бо ви засмутились для Бога, щоб ні в чо́му не мати втрати від нас.
Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu.
10 Бо смуток для Бога чинить каяття́ на спасі́ння, а про нього не жалуємо, а смуток світськи́й — чинить смерть.
Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ.
11 Бо ось саме це, що ви засмутились для Бога, яку пильність велику воно вам зробило, яку оборону, яке обурення, який страх, яке бажа́ння, яку горливість, яку по́мсту! Ви в усім показали, що чисті ви в справі.
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile.
12 А коли я й писав вам, то не через того, хто кри́вдить, і не через покри́вдженого, а щоб виявилася для вас наша пильність про вас перед Богом.
Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi.
13 Тому́ то потіхою вашою вті́шились ми, а ще більше зраділи ми радістю Тита, що ви всі заспоко́їли духа його.
Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
14 Бо коли я про вас йому чим похвалився, то не осоро́мився; але як ми вам говорили все правду, так і наша хвала́ перед Титом правдива була́!
Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
15 І серце його прихильніше до вас, коли згадує він про покору всіх вас, як його прийняли́ ви були зо стра́хом і тремті́нням.
Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya.
16 Отож, тішуся я, що мо́жу покластись у всьому на вас!
Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.

< 2 до коринтян 7 >