< Від Луки 5 >

1 Одного разу, коли [Ісус] знаходився біля озера Генезарет і натовп людей тиснувся до Нього, аби слухати Слово Боже,
Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke.
2 Він побачив два човни, що стояли біля берега. А рибалки, вийшовши з них, чистили сіті.
Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ.
3 [Ісус] увійшов до одного з човнів, який належав Симонові, попросив його відплисти трохи від берега й, присівши, навчав людей із човна.
Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.
4 Коли ж закінчив говорити, сказав Симонові: ―Відпливи на глибину, та закиньте сіті для лову.
Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”
5 Симон сказав у відповідь: ―Наставнику, ми цілу ніч працювали та нічого не впіймали, але за Твоїм словом я закину сіті.
Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.”
6 Зробивши це, піймали так багато риби, що сіті почали рватись.
Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị.
7 Вони покликали й своїх товаришів з іншого човна, щоб прийшли допомогти їм. Ті прийшли й наповнили рибою обидва човни так, що вони стали потопати.
Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.
8 Побачивши це, Симон Петро припав до колін Ісуса та промовив: ―Господи, відійди від мене, бо я людина грішна!
Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”
9 Адже страх охопив його й усіх, хто був із ним, від такої кількості спійманої риби,
Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.
10 а також Якова та Івана, синів Зеведеєвих, котрі були спільниками Симона. І промовив Ісус до Симона: ―Не бійся, віднині будеш ловити людей.
Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.”
11 Витягнувши човни на берег, вони залишили все та пішли за Ним.
Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
12 Коли [Ісус] перебував в одному місті, прийшов до нього чоловік, що був увесь покритий проказою. Побачивши Ісуса, він впав долілиць та просив Його, кажучи: ―Господи, якщо хочеш, Ти можеш мене очистити.
Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
13 [Ісус] простягнув руку, доторкнувся до нього й промовив: ―Хочу, будь чистим! І вмить проказа залишила його.
Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya.
14 [Ісус] наказав йому: ―Нікому не кажи про це, але йди, покажи себе священникові та принеси жертву за своє очищення, як наказав Мойсей, їм на свідчення.
O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
15 Однак звістка про Ісуса розходилася ще більше, і багато людей приходило до Нього послухати та отримати зцілення від своїх хвороб.
Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa.
16 Він же відходив у пустелю та молився там.
Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
17 Одного дня, коли [Ісус] навчав людей, були там фарисеї та вчителі Закону, що прийшли з усіх сіл Галілеї та Юдеї, а також з Єрусалима; і сила Господня була з Ним, щоби зцілювати,
Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa.
18 І ось декілька людей принесли на носилках паралізованого та хотіли внести його й поставити перед Ісусом.
Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya.
19 Не маючи можливості внести його через натовп, вони залізли на дах та спустили його разом із носилками через отвір у покрівлі на середину, прямо перед Ісусом.
Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
20 Побачивши їхню віру, Він промовив: «Друже, прощаються тобі гріхи твої!»
Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”
21 Книжники та фарисеї почали розмірковувати кажучи: «Хто Він такий, що богохульствує? Хто може прощати гріхи, окрім Самого Бога?»
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?”
22 Але Ісус, знаючи їхні думки, відповів: «Чому ви так роздумуєте у ваших серцях?
Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu?
23 Що легше сказати: „Прощаються тобі гріхи твої!“чи „Встань і ходи!“?
Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije?
24 Але щоб ви знали: Син Людський має владу на землі прощати гріхи». І промовив до паралізованого: «Кажу тобі: встань, візьми свої носилки та йди додому!»
Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!”
25 Той відразу ж встав перед ними, узяв те, на чому лежав, і пішов додому, прославляючи Бога.
Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.
26 Усіх охопив подив, і почали прославляти Бога. Сповнені страхом, вони говорили: «Дивовижні речі ми бачили сьогодні!»
Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”
27 Після цього [Ісус] вийшов та побачив митника, на ім’я Левій, що сидів при збиранні мита, і сказав йому: «Іди за Мною!»
Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.”
28 Залишивши все, той піднявся й пішов за Ісусом.
Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya.
29 І влаштував Йому Левій у своєму домі велику гостину; там було багато митників та інших, що сиділи з Ісусом за столом.
Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ.
30 А фарисеї та книжники нарікали, кажучи Його учням: ―Чому ви їсте та п’єте разом із митниками й грішниками?
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?”
31 Ісус же відповів їм: ―Не здорові потребують лікаря, а хворі.
Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike.
32 Я прийшов покликати до покаяння не праведних, а грішників.
Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
33 Тоді вони сказали Йому: ―Учні Івана часто постяться та моляться, так роблять і фарисеї, а Твої їдять і п’ють!
Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.”
34 Ісус відповів: ―Чи можете друзів нареченого змусити постити, доки наречений з ними?
Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ?
35 Але настануть дні, коли наречений забереться від них, і тоді поститимуть у ті дні.
Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”
36 Він розповів їм притчу: ―Ніхто не розриває нової одежі, щоби з неї пришити латку до старої одежі, бо й нову розірве, і до старої не пасує латка з нової.
Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba.
37 Ніхто не вливає молодого вина в старі бурдюки, бо молоде вино розірве їх і виллється, а бурдюки пропадуть.
Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi.
38 Але молоде вино треба вливати в нові бурдюки.
Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.
39 І ніхто, випивши старого вина, не захоче молодого, бо каже: «Старе краще!»
O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’”

< Від Луки 5 >