< Romalilar 12 >

1 Öyleyse kardeşlerim, Tanrı'nın merhameti adına size yalvarırım: Bedenlerinizi diri, kutsal, Tanrı'yı hoşnut eden birer kurban olarak sunun. Ruhsal tapınmanız budur.
Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
2 Bu çağın gidişine uymayın; bunun yerine, Tanrı'nın iyi, beğenilir ve yetkin isteğinin ne olduğunu ayırt edebilmek için düşüncenizin yenilenmesiyle değişin. (aiōn g165)
Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke. (aiōn g165)
3 Tanrı'nın bana bağışladığı lütufla hepinize söylüyorum: Kimse kendisine gereğinden çok değer vermesin. Herkes Tanrı'nın kendisine verdiği iman ölçüsüne göre düşüncelerinde sağduyulu olsun.
Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.
4 Bir bedende ayrı ayrı işlevleri olan çok sayıda üyemiz olduğu gibi, çok sayıda olan bizler de Mesih'te tek bir bedeniz ve birbirimizin üyeleriyiz.
Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,
5
nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.
6 Tanrı'nın bize bağışladığı lütfa göre, ayrı ayrı ruhsal armağanlarımız vardır. Birinin armağanı peygamberlikse, imanı oranında peygamberlik etsin.
Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha.
7 Hizmetse, hizmet etsin. Öğretmekse, öğretsin.
Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe.
8 Öğüt veren, öğütte bulunsun. Bağışta bulunan, bunu cömertçe yapsın. Yöneten, gayretle yönetsin. Merhamet eden, bunu güler yüzle yapsın.
Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.
9 Sevginiz ikiyüzlü olmasın. Kötülükten tiksinin, iyiliğe bağlanın.
Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.
10 Birbirinize kardeşlik sevgisiyle bağlı olun. Birbirinize saygı göstermekte yarışın.
Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.
11 Gayretiniz eksilmesin. Ruhta ateşli olun. Rab'be kulluk edin.
Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
12 Umudunuzla sevinin. Sıkıntıya dayanın. Kendinizi duaya verin.
Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.
13 İhtiyaç içinde olan kutsallara yardım edin. Konuksever olmayı amaç edinin.
Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.
14 Size zulmedenler için iyilik dileyin. İyilik dileyin, lanet etmeyin.
Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
15 Sevinenlerle sevinin, ağlayanlarla ağlayın.
Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
16 Birbirinizle aynı düşüncede olun. Böbürlenmeyin; tersine, hor görülenlerle arkadaşlık edin. Bilgiçlik taslamayın.
Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
17 Kötülüğe kötülükle karşılık vermeyin. Herkesin gözünde iyi olanı yapmaya dikkat edin.
Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.
18 Mümkünse, elinizden geldiğince herkesle barış içinde yaşayın.
Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.
19 Sevgili kardeşler, kimseden öç almayın; bunu Tanrı'nın gazabına bırakın. Çünkü şöyle yazılmıştır: “Rab diyor ki, ‘Öç benimdir, ben karşılık vereceğim.’”
Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
20 Ama, “Düşmanın acıkmışsa doyur, Susamışsa su ver. Bunu yapmakla onu utanca boğarsın.”
Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”
21 Kötülüğe yenilme, kötülüğü iyilikle yen.
Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.

< Romalilar 12 >