< Yeşaya 12 >

1 İsrail halkı o gün, “Ya RAB, sana şükrederiz” diyecek, “Bize öfkelenmiştin ama öfken dindi, Bizi avuttun.
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi.
2 Tanrı kurtuluşumuzdur. O'na güvenecek, yılmayacağız. Çünkü RAB gücümüz ve ezgimizdir. O kurtardı bizi.”
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
3 Kurtuluş pınarlarından sevinçle su alacaksınız.
Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
4 O gün diyeceksiniz ki, “RAB'be şükredin, O'nu adıyla çağırın, Halklara duyurun yaptıklarını, Adının yüce olduğunu duyurun!
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
5 RAB'be ezgiler söyleyin, Çünkü görkemli işler yaptı. Bütün dünya bilsin bunu.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
6 Ey Siyon halkı, sesini yükselt, sevinçle haykır! Çünkü aranızda bulunan İsrail'in Kutsalı büyüktür.”
Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

< Yeşaya 12 >