< Zaburi 79 >

1 Zaburi ya Asafu. Mungu, Mataifa ya kigeni yameingia kwenye urithi wako; wamelinajisi hekalu lako takatifu; wameigeuza Yerusalemu kuwa chungu cha magofu.
Abụ Ọma Asaf. O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
2 Wamezitoa maiti za watumishi wako ziwe chakula cha ndege wa angani, miili ya watakatifu wako iwe chakula cha wanyama wa nchi.
Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
3 Wamemwaga damu zao kama maji sehemu zote za Yesrusalemu, na hakuwepo wa kuwazika.
Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
4 Sisi tumekuwa aibu kwa majirani zetu, tukidhihakiwa na kuzomewa na wale wanaotuzunguka.
Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
5 Mpaka lini Yahwe? Utabaki kuwa na hasira milele? Ni kwa muda gani hasira yako ya wivu itawaka kama moto?
O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
6 Mwaga hasira yako juu ya mataifa ambayo hayakujui wewe na ufalme ambao hauliiti jina lako.
Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;
7 Kwa maana walimvamia Yakobo na waliharibu kijiji chake.
nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
8 Usiendelee kukumbuka dhambi za baba zetu dhidi yetu; matendo yako ya huruma yaje kwetu, maana tuko chini.
Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
9 Utusaidie, Mungu wa wokovu wetu, kwa ajili ya utukufu wa jina lako; utuokoe na usamehe dhambi zetu kwa ajili ya jina lako.
Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.
10 Kwa nini mataifa yalazimike kusema, “Mungu wao yuko wapi?” Damu ya watumishi wako ambayo ilimwagwa na ilipize kisasi juu ya mataifa mbele ya macho yako.
Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
11 Kilio cha wafungwa na kije mbele zako; kwa uweza wa nguvu zako uwaweke ai wana wa mauti.
Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
12 Uwalipize majirani zetu vifuani mwao mara saba zaidi ya walivyo kutukana wewe, Bwana.
Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
13 Hivyo sisi watu wako na kondoo wa malisho yako tutakushukuru milele. Tutazisimulia sifa zako kwa vizazi vyote.
Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

< Zaburi 79 >