< Zaburi 60 >

1 Mungu, wewe umetutupa; umeuvunja ulinzi wetu; wewe umekuwa hasirani; utuwezeshe tena.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
2 Wewe umeifanya nchi kutetemeka; umeipasua pasua; uiponye nyufa zake, maana zinatikisika.
I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
3 Wewe umewafanya watu wako kuona mambo magumu; umetufanya tunywe mvinyo wenye kutufanya kupepesuka.
I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
4 Kwa wale wanao kuheshimu wewe, wewe umeweka bandera ionekane dhidi ya wale wabebao upinde. (Selah)
Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. (Sela)
5 Ili kwamba wale uwapendao waweze kuokolewa, utuokoe sisi kwa mkono wako wa kuume na unijibu.
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
6 Mungu ameongea katika utakatifu wake, “Nitashangilia; nitaigawanya Shekemu na kuligawa bonde la Sukothi.
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
7 Gileadi ni yangu, na Manase ni yangu na Ephraimu pia ni kofia yangu ya chuma; Yuda ni fimbo yangu ya kifalme.
Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
8 Moabu ni bakuli langu la kunawia; juu ya Edomu nitatupa kiatu changu; nitapiga kelele za ushindi kwa sababu ya Filisti.”
Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
9 Ni nani atakaye nileta kwenye mji imara? Ni nani ataniongoza kwenda Edomu?
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
10 Lakini wewe, Mungu, je, haukutukataa? Wewe hauendi vitani pamoja na jeshi letu.
Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
11 Utusaidie dhidi ya adui yetu, maana msaada wa mwanadamu ni bure.
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
12 Kwa msaada wa Mungu tutashinda; yeye atawakanyaga chini adui zetu.
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

< Zaburi 60 >