< Zaburi 45 >

1 Moyo wangu unafurika kwa neno zuri; nitasoma kwa sauti maneno niliyo yaandika kuhusu mfalme; ulimi wangu ni kalamu ya mwandishi mwenye ustadi.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ. Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
2 Wewe u mzuri sana kuliko mwanadamu yeyote; neema imemiminwa midomoni mwako; Kwa hiyo tunajua ya kuwa Mungu amekubariki milele.
I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
3 Weka upanga wako upande wako, wewe uliye mwenye nguvu, katika utukufu wako na enzi yako.
Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
4 Katika enzi yako enenda katika ushindi kwa sababu ya uaminifu, upole, na haki; mkono wako wa kuume utakufundisha mambo ya kutisha.
Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
5 Mishale yako ni mkali; watu huanguka chini yako; mishale yako imo ndani ya mioyo ya adui za mfalme.
Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
6 Kiti chako cha enzi, Mungu ni cha milele na milele; na fimbo ya haki ni fimbo ya utawala wako.
O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
7 Umeipenda haki na kuchukia uovu; kwa hiyo Mungu, Mungu wako, amekupaka mafuta ya furaha kuliko wenzako.
Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
8 Mavazi yako yote hunukia manemane, udi, na mdalasini; kukoka katika majumba ya pembe vyombo vya muziki wa nyuzi vimekufurahisha.
Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
9 Binti za wafalme ni kati ya wake zako waheshimiwa; na mkono wako wa kuume amesimama malikia aliye vaa mavazi ya dhahabu ya Ofiri.
Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
10 Sikiliza, mwanangu, tafakari na utege sikio lako; uwasahahu watu wako na watu wa nyumba ya baba yako.
Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
11 Hivyo mfalme atautamani uzuri wako; yeye ni Bwana wako; umstahi.
Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
12 Binti wa Tiro atakuwepo akiwa na zawadi; matajiri kati wa watu watajipendekeza kwako.
Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
13 Binti mfalme katika jumba la kifahari ana utukufu wote; mavazi yake yametengenezwa kwa dhahabu.
Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
14 Naye ataongozwa kwa mfalme akiwa katika mavazi ya dhahabu; mabikra, wenzake wanoumfuata, wataletwa kwako mafalme.
Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
15 Wao wataongozwa kwa furaha na shangwe; wataingia mahali pa mfalme.
E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.
16 Katika mahali pa baba zako watoto wako watakuwepo, ambao wewe utawafanya kuwa wakuu katika nchi yote.
Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
17 Nami nitalifanya jina lako kukumbukwa katika uzao wote; kwa hiyo watu watakushukuru milele na milele.
Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

< Zaburi 45 >