< Zaburi 32 >

1 Zaburi ya Daudi. Zaburi. Amebarikiwa mtu yule aliyesamehewa makosa yake, ambaye dhambi zake zimesitiriwa.
Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
2 Amebarikiwa mtu yule ambaye Yahwe hamuhesabii hatia na ambaye rohoni mwake hamna udanganyifu.
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
3 Nilipokaa kimya, mifupa yangu ilidhohofika huku nikiugua muda wote.
Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
4 Mchana na usiku mkono wako ulinielemea. nguvu zangu zilikauka wakati wa kiangazi. (Selah)
Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. (Sela)
5 Ndipo nilipotambua makosa yangu kwako, nami sifichi tena uovu wangu. Nilisema, “Nitakiri makosa yangu kwa Yahwe,” nawe ulinisamehe hatia ya dhambi zangu. (Selah)
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. (Sela)
6 Kwa sababu ya haya, wale wote ambao ni wa kimungu wanapaswa kukuomba wakati wa shida kubwa. Nayo mafuriko yajapo, hayatawapata watu hao.
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
7 Wewe u mahali pangu pa kujifichia, nawe utanilinda matatizoni. Wewe utanizunguka pamoja na nyimbo zaushindi. (Selah)
Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. (Sela)
8 Nitakuelekeza na kukufundisha katika njia upasayo kuiendea. Nitakuelekeza huku macho yangu yakikutazama.
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
9 Msiwe kama farasi au kama nyumbu, ambao hawana uelewa; ni kwa hatamu na lijamu tu unaweza kuwapeleka popote utakapo wao waende.
Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
10 Waovu wanahuzuni nyingi, bali uaminifu wa agano la Yahwe utamzunguka yule anaye mwamini yeye.
Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
11 Furahini katika Yahwe, na mshangilie, ninyi wenye haki; pigeni kelele za shangwe, ninyi nyote wenye haki mioyoni mwenu.
Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.

< Zaburi 32 >