< Zaburi 17 >

1 Maombi ya Daudi. Sikia ombi langu kwa ajili ya haki, Yawhe; uusikilize mwito wangu wa msaada. Uyasikilize maombi yangu yatokayo katika midomo isiyo na udanganyifu.
Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.
2 Uthibitisho wangu na uje kutoka uweponi mwako; macho yako na yaone kile kilicho sahihi!
Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
3 Kama utaujaribu moyo wangu, kama utakuja kwangu wakati wa usiku, wewe utanitakasa na hautapata mipango yeyote ya uovu; mdomo wangu hautavunja sheria.
Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.
4 Kama kwa matendo ya binadamu, ni katika neno la midomo yako ya kuwa nimejiepusha na njia za wahalifu.
Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
5 Mwenendo wangu umeshikila kwa umakini mwenendo wako; miguu yangu haija teleza.
Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.
6 Nakuita wewe, kwa kuwa unanijibu, Mungu; geizia sikio lako kwangu na usikilize ninapo ongea.
Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
7 Onyesha uaminifu wa agano lako katika namna ya ajabu, wewe uokoaye kwa mkono wa haki yako wale wanao kukimbilia wewe kutoka kwa adui zao.
Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
8 Unilinde kama mboni ya jicho lako; unifiche katika kivuli cha mbawa zako
Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
9 kutoka katika uwepo wa waovu ambao wananitusi, adui zangu wanizungukao.
site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
10 Wao hawana huruma kwa yeyote; midomo yao huongea kwa majivuno.
Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
11 Wao wame zizunguka hatua zangu. Wamekaza macho yao wanishambulie mpaka ardhini.
Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
12 Wao ni kama mfano wa hasira ya simba mawindoni. Ni kama simba kijana anapotokea mafichoni.
Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
13 Inuka, Yahwe! Uwashambulie! Uwaangushe chini kwenye nyuso zao! Uyaokoe maisha yangu kutokana na waovu kwa upanga wako!
Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
14 Uniokoe kutoka kwa watu hawa kwa mkono wako, Yahwe, kutoka kwa watu wa dunia hii ambao utajiri wao ni maisha haya pekee! Wewe utayajaza matumbo ya wale uwathaminio na utajiri; watakuwa na watoto wengi na wataacha utajiri wao kwa watoto wao.
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
15 Bali mimi, nitauona uso wako katika haki; Nitashuhudiwa, pale nitakapo amka, na macho yako.
Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.

< Zaburi 17 >