< Zaburi 144 >

1 Atukuzwe Yahwe, mwamba wangu, anifundishaye mikono yangu vita na vidole vyangu kupigana.
Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
2 Wewe ni uaminifu wa agano langu na ngome yangu, mnara wangu mrefu na uniokoaye, ngao yangu na yule ambaye katika yeye napata kimbilio, uyatiishaye mataifa chini yangu.
Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.
3 Ee Yahwe, mtu ni kitu gani hata umtazame au mwana wa mtu hata umfikirie?
O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
4 Mtu ni kama pumzi, siku zake ni kama uvuli upitao.
Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.
5 Ee Yahwe uziinamishe mbingu na ushuke chini, uiguse milima na uifanye kutoa moshi.
O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
6 Utume umeme uwatawanye adui zangu; upige mishale yako na uwavuruge.
Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.
7 Nyosha mkono wako toka juu; uniokoe kutoka katika maji mengi, na kutoka katika mkono wa wageni.
Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ,
8 vinywa vyao hunena uongo, na mkono wao wa kuume ni mkono wa uongo.
ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
9 Nitakuimbia wimbo mpya, Mungu; kwa kinanda cha nyuzi kumi nitakuimbia sifa wewe,
O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
10 uwapaye wafalme wokovu, uliye muokoa Daudi mtumishi wako dhidi ya upanga wa uovu.
gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ
11 Uniokoe na unitoe mkononi mwa wageni. Midomo yao huongea uongo, na mkono wao wa kuume ni mkono wa uongo.
gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
12 Wana wetu na wawe kama mimea ikuayo kwa ukumbwa timilifu katika ujana wao na binti zetu kama nguzo za pembeni, zilizonakishiwa kwa kupamba jumba la kifahari.
Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma.
13 Ghala zetu na zijae akiba ya kila aina ya mazao, na kondoo wetu wazae elfu na makumi elfu mashambani mwetu.
Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;
14 Kisha ng'ombe wetu watakuwa na nddama wengi. Hakuna atakayevunja kuta zetu; hakutakuwa na uhamisho wala kilio mitaani mwetu.
igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
15 Wamebarikiwa watu wenye baraka hizo; furaha ina watu ambao Mungu wao ni Yahwe.
Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.

< Zaburi 144 >