< Zaburi 132 >

1 Yahwe, kwa ajili ya Daudi kumbuka mateso yake yote.
Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.
2 Kumbuka ndiye aliye mwapia Yahwe, aliweka nadhiri kwa Shujaa wa Yakobo.
Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:
3 Alisema, sitaingia nyumbani mwangu wala sitaenda kitandani mwangu,
“Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m,
4 sitayapa macho yangu usingizi wala kope zangu kupumzika
agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,
5 mpaka nitakapopata mahali kwa ajili ya Yahwe, na maskani kwa ajili ya Shujaa wa Yakobo.”
tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
6 Tazama tulisikia kuhusu hilo katika Efrata; tuliipata katika konde la Yearimu.
Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.
7 Tutaingia katika maskani ya Mungu; tutasujudu miguuni pake.
“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
8 Inuka, Ee Yahwe, uje mahali pako pa kupumzika, wewe na sanduku la nguvu zako!
‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
9 Makuhani wako na wavikwe uadilifu; waaminifu wako washangilie.
Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’”
10 Kwa ajili ya mtumishi wako Daudi, usimuache mfalme wako uliye mpaka mafuta.
Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
11 Yahwe alimwapia Daudi kiapo cha uhakika, kiapo cha uhakika ambacho hatakivunja: “Nitamuweka mmoja wa wazawa wako kwenye kiti chako cha enzi.
Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,
12 Kama wana wako watalishika agano langu na sheria ambazo nitawafundisha, watoto wao pia watakaa kwenye kiti chako cha enzi milele.”
ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
13 Hakika Yahwe ameichagua Sayuni, ameitamani kwa ajili ya makao yake.
Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
14 “Hapa ni mahali pangu pa kupumzika milele. Nitaishi hapa, kwa kuwa ninapatamani.
“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
15 Nitapabariki sana kwa mahitaji. Nitawatosheleza maskini wake kwa mkate.
Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
16 Nitawavisha makuhani wake kwa wokovu, waaminifu wake watashangilia kwa furaha.
Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
17 Hapo nitachipusha pembe kwa ajili ya Daudi na kuweka taa juu kwa ajili ya mpakwa mafuta wangu.
“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
18 Nitawavisha adui kwa aibu, bali juu yake taji yake itang'aa.”
Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”

< Zaburi 132 >